Haiti – Vertières : «Asachiela otu usoro n’akụkọ mba ala a. Eferela n’usoro ọhụrụ» Jovenel Moïse

Spread the love

 

Haiti - Vertières : «A page of history is turned, a new chapter opens» dixit Jovenel Moïse

N’ụbọchị Satodee, Onyeisiala Hayiti Jovenel Moïse, nakwa nwunye ya bụ Martine tinyekwara Onowu mba ahụ bụ Jack Guy Lafontant, sonyere na mmemme Haut du Cap, nke eji eme ncheta narị afọ abụọ n’iri n’anọ nke Ọgụ  Vertières,  bụ ọgụ wetara ala Hayiti nnwere onwe n’abalị mbụ nke ọnwa Jenuwarị afọ, 1804.

Ọchịagha du n’agha hụ ha nọrọ merie ndi agha Onye Eze Napoleon Bonaparte bụ Ọchịagha Toussaint L’Ouverture. Anyị ga-echetakwa na ndi Hayiti bụ Ndigbo.

Onyeisiala ahụ nọrọ n’ihu ndi ọzọ nile ọnụ na-eru n’okwu na mba ahụ were dọsa okooko n’ụkwụ akpụrụakpụ nke  Vertières, iji kwanyere ndi dike  lụrụ ọgụ nnwere onwe mba ahụ ugwu.

Onyeisiala Moïse gaziri na College Notre Dame du Cap-Haitien  were sonye n’ụka inye ekele nke  Aachịbishọọpụ nke Cap, Mgr. Max Leroy Mezidor kara

Onyeisiala ahụ gakwara na Carrénage Boulevard, were nọrọ n’ihu ndi isi ndi agha mba ahụ nyefee ọkọrọtọ ala ahụ n’aka ụsụụ ndi agha mba Hayiti nakwa ịkwụ n’ahịrị n’ahịrị nke ndi agha ahụ.

N’ozi ya n’oge ahụ, Onyeisiala Jovenel kwuru sị:

“[…] N’ụbọchị taa a na-eme mmemme mmeri n’agha nke wetara nnwere onwe, ọnọdụ ka dịmma ugbua maka ịkpọlite mmụọ nke ala anyị, isi n’ụra metee ike nke ala anyị nke dara n’ụra site n’esemokwu dị n’etiti anyị ahapụrụ ka ọ gatee aka.

N’abalị iri n’asatọ nke ọnwa Nọvemba n’ebe a anyị guzoro bụ ala nsọ, nna nna anyị ha nwetara mmeri n’agha nke hiwere ala anyị, Hayiti anyị hụrụ n’anya. Ụsụụ ndi agha abụọ chere onwe ha ihu. Ụsụụ ndi agha ndi nwe obodo, ndi agha ndi nna nna anyị meriri…….

O! unu ndi dike nke Vertières,  unu ụmụibe site n’ikikere m dịka Onyeisiala, e sekpuoro m unu, ndi ichie bụ odogwu. Vertières  bụ agbamume dịịrị ọtụtụ mba n’ụwa gbaa gburu gburu


[…]

A na m ekwu ya ma na-ekwukwa ya ọzọ, ala ga-esolata ụzọ ọhụrụ, ọ ga-aghazigharịlata ọdịnihu ya site n’oge ugbua nke gbadoro ụkwụ n’ọrụ ziri ezi nke ga-eme ka enwe ito uto akụnụba, agamnihu nakwa ịkwalite ikikere dịịrị ụmụ amala.
[…]

 

A na m’ ekwuputa na otu usoro maka akụkọ mba ala a eferela. Abanyewo na usoro ọhụrụ: ndi agha  aghazigharịrị nke ọma, mba na-eme ihe n’usoro iwu, iji mee ka enwee ezi nchekwa maka ndụ nakwa akụnụba nke ụmụ amala.

A na m akpọku unu nile, ndi ndọrọ ndọrọ na-echere m aka mgba, ndi bi n’ime obodo, ndi bi n’obodo mepere emepe, ndi ọrụ, ụmụ akwụkwọ, ndi nkuzi, ndi Hayiti bi ala bekee, oge eruola maka inwe mmụọ ezi mgbanwe n’ala a

hoo!haa!! sonyere ụmụ nwannne anyị ndi Hayiti na mmemme ncheta mmeri n’agha ha nwere n’abalị iri n’asatọ nke Ọnwa Nọvemba afọ 1803 n’okpuru odogwu Igbo, Ọchịagha Toussaint L’Ouverture

Toussaint L’Ouverture

 

http://www.haitilibre.com/en/news-22741-haiti-vertieres-a-page-of-history-is-turned-a-new-chapter-opens-dixit-jovenel-moise.html

Leave a Reply

Your email address will not be published.