Gwa Buratai ka ọ kpọpụta Kanụ-Abaribe na-agwa ụlọikpe

Spread the love

ABỤJA – Sinetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite anya mpaghara Ndịda Abịa(Abịa South) n’ụlọ Nzuko Sineti ma bụrụkwa otu onye na ime madụ atọ naara Mazị Nnamdị Kanụ, onyeisi otu Indigenous Peoples of Biafra (IPOB) a na-efu efu n’akaebe n’ụlọikpe etinyela akwụkwọ n’ụlọikpe ka ndi Agha Naịjiriya kwụọ ya Nde Naịra Iri (N10million) maka nchekasị nakwa mmapụ obi o nwetara site na nwakpo ndi agha wakporo Kanụ  nke megidere usoro iwu kpatara o jiri fuo.

Abaribe na-arịokwa Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe Etiti n’Abụja ka Ichie Ọchịagha ndi Agha Naịjiriya, Lt.-Gen. Tukur Buratai kwụkwuo ego nile o mefuru maka ikpe Nnamdị Kanụ. Ọ gwara ụlọikpe na Ndi Agha Naịjiriya nọrọ n’agha ha buru site n’abalị iri n’otu nke ọnwa Septemba were wakpo obodo nakwa ụlọ Kanụ bụ nke ndi nta akụkọ sịrị na o butere ịkwa mgbọ nakwa ọgbaghara. Ọ kọwakwara na Kanụ”  bụ onye enweghizikwa ike ịhụ anya ma ọ bụ nweta na ekwentị kemgbe ahụ, na enwebekwaghị ozi si n’aka ndi nta akụkọ na o nwewo onye hụrụ ya anya ma ya fọzịa yanwa izipu ozi ọbụla nye ndi nta akụkọ banyere okwu ahụ”

Abaribe gwakwara ụlọikpe na “ume ya erughi na ịkpọpụta onye onye nke mbụ a gbara akwụkwọ (Ndi Agha Naịjiriya) kọwara dịka onye otu iyi ọha ụjọ (terrorist organization) ma ọ bụkwanụ onye ọbụla nke onye mbụ a gbara akwụkwọ nwere mmasị na ị mata ebe ọ nọ.

Abaribe sịrị na arịrịọ a o wetara n’ihu ụlọikpe gbadoro ụkwụ na ” Site na añumọkụ n’obi ya nwere inyere ndi ụlọikpe aka were bịanyụlata ọghaghara na-achọ ịdapụta n’ala anyị mgbe ahụ mere ya jiri gaa nara Kanụ n’akaebe n’ihu ụlọikpe maka na ya kwenyere na ọ gaghị agbalaga tinyekwara na ọ ga-eme ihe ọbụla ọ na-eme n’usoro na emegideghị iwu ala Naịjiriya”

Ọ gakwara n’ihu kọwaa na mgbe Ichie Ọchịagha Ndi Agha Naịjiriya gara ịwakpo be Kanụ, na ha mara na okwu ahụ dị adị n’ụlọikpe, na ọ bụkwanụ mwakpo a mere na Kanụ enweghịzị ike ịbịanwu ụlọikpe bịa zara ọnụ ya

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.