IHE M MAARA MAKA ALEX EKWUEME NWỤGORO ANWỤ – BABANGIDA

Spread the love

Onye chịburu ala Naịjiria ọchịchị ndị amị, Ibrahim Babangida esonyela ndị Naịjirịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu n’iru uju onye bụ buru onye osote onye isi ala obodo anyị.

Babangida kọwara ọnwụ Ekwueme dịka oké ihe funahụrụ Naijiria, ọ kachasị ugbua ọ nwụrụ ebe a na-achọ ndị isi awọ maara maka obodo na ezi nhazi.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ụlọ ọrụ onye a chịgoro ọchịchị ndị amị kwuru na Monde, ụbọchị iri abụọ n’ọnwa Novemba na Minna, steeti Naija na Babangida nọ n’ezigbo nwute maka ọnwụ Ekwueme

Okwu ya gosiri na Babangida natara ozi maka ọnwụ Ekwueme n’obi iwe mana ihe kasiri ya obi bụ ụdị ndụ ịma atụ o biliri mgbe ọ nọ n’ụwa.

Babangida kwuru si na ọ na e sonyere ndị Naịjirịa niile n’iru uju ọnwụ Ekwueme ma kọwakwaa ya bụ onye bụgoro osote onye isi ala dịka ezigbo mmadụ nwere ezigbo agwa.

Ginikachi Anyaobasi

Leave a Reply

Your email address will not be published.

7 + 8 =