Ịmegharị Nhọpụta Sineti Anambara Central:Hapụ ọrụ mịnịsta bịa ka anyị chịpụ ya, Umeh na-agwa Ngige

Spread the love

Anambra Central re-run: Resign and challenge me, Umeh tells Ngige

Onye ji aha otu ndọrọ ndọrọ All Progressives Grand Alliance (APGA) na nhọpụta Sineti mpaghara Anambra Central Senatorial, Ichie Viktọ Umeh, echeworo Mịnista na-ahụ maka ọrụ, Dọkịnta Kris Ngige, ka ọ gbaa alụkwaghịm n’ọrụ ya dịka mịnịsta bịa ka ha chịpụ ya na ya bụ nhọpụta.

Umeh gwara ya bụ mịnịsta onye e nyere ikike ịzọ ya bụ nhọpụta n’aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) n’afọ 2015 ka o soro zọọ ya bụ nhọpụta

N’okwu ọ gwara ndi nta  akụkọ n’ụlọ ya n’obodo ya, Agulu Ezigbo, Umeh bụ onye jibu  ọkwa dịka onyeisioche otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA, katọrọ akparamagwa ụfọdụ ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị si na mpaghara ahụ maka ịnapụ ndi mpaghara ahụ ohere inwe sinetọ na-anọchị anya ha n’Abụja.

Ọ kpọkuru INEC ka ọ gbachite ndi oso-chi-egbu ahụ ntị ma gaa n’ihu ime ya bụ nhọpụta site na ntuzi aka ụlọ ikpe mkpegharị nyere n’ikpe ha nke Abalị iri abụọ nke ọnwa Novemba.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

2 × five =