AVỌ-EMUDO

Spread the love

Taa bụ Afọ, ahịa anyị ga-aga taa bụ AVỌ-EMUDO.

Ahịa Avọ (Afọ) Emudo dị n’Emudo-Nenwe nke dị n’Okpuru Ọchịchị Anịnri nke Enugwu Steeti.

Ihe e jiri mara ahịa Avọ-Emudo bụ anụ jaki.

 

A na-esi Steeti dịgasị n’Ugwu Awụsa dịka Kebbi nakwa Katsịna ebute ya bụ anụma n’Avọ-Emudo ebe a na-anọ egbu ha ma rekwaa anụ ha. Akpụkpọ ya bakwara uru maka na ndi na-arụpụta akarangwa akpụkpọ anụ dịka akpa, akpụkpọ ụkwụ, eriri ukwu, w.d.g. na -abịa azụ ya. Ọbụladị ọkpụkpụ ya bụkwa ego, ndi na-arụpụta efere nkụwa na-azụ ya dịka akarangwa.

Ma ụmụ nwanyị, ma ụmụ nwoke na-eso egbu ya bụ jaki ma na-erekwa ya. Ndi mmadụ na-esi mpaghara Ala-Igbo dị iche iche dịka Abịa, Imo, Anambara nakwa Rivas Steeti.

 

     

Ihe ndi ọzọ a na-enweta na-ahịa a gụnyere osikapa, ọkwụrụ nakwa ahuekere. Ihe ndia nile bụ ihe ndi obodo ahụ na-akọpụta nke ukwuu.

N’oge udummiri, ihe ndia na abụ atụrụ tawa ma dịkwa oke ọnụ ala.

Nenwe dị ihe dịka Kilomita iri n’ise site n’Enugwu. Ọ dịpụtakwara n’ụzọ awara awara si Enugwu were gaa Pọt Hakọọtụ. Ị batazie Nenwe, i nweta Emudo.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.