OKENYE

OKENYE 

40 Comments

  1. Okenye adịghị mma ịgwọ ofe

  2. okenye ji eze ekere ụmụ aka anụ agaghị asị na ọ taghị anụ

  3. okenye ekwesịghị ịnọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbụ

  4. Author

    Nenwe: Okọkpa bụ ji anwụ
    Igbo Izugbe: Okenye bụ ji ọkpọọ. Ọ pụtara na onye bụrụ gi okenye siri ike n’ebe ị nọ dịka ji anwụ.

  5. Okenye anaghi ano na ulo ewu amuo na ogbili.

  6. Nka ka okenye ji agbara ehi oso

  7. Nwata kwuwa onu osi na ya agwagbuo okenye na okwu.

  8. Ihe okenye tukwu ani were fu nwata kwuru oto ogaghi ahu ya.

  9. Okenye na-enyo otule ga-ahu ihe di n’ otule.

  10. Nwata kwochaa aka osoro okenye rie ihe.

  11. Okenye hapuru umuaka agba ya, ha dobaya na afu onu.

    1. Chinedu i nwaala hoo!haa!!

  12. Okenye adighi eri oke

  13. Okenye si na ya amaghi egbu ala bu okenye aruru ala

  14. Anya mmiri okenye n’acha nzu nzu.

  15. Okenye be akwa ka nwata orimili agba ya n’anya

  16. Ihe okenye jo ahu uzo erika

  17. Nwata yikaria Uwe okenye (nna ya) odoro nna ya anya na ugwu di na uwe ahu efuela hoo!haa!!

  18. Nwata gwa okenye ebe o na eje…o gwa ya ihe o ga ekwu ma mee ma orue…nwata amaghi gaa o gaa ya n ga naabo

  19. Nwata neso okenye kwadaa…otaghi oji otaa ose oji

  20. Nwata ribe nri okenye ndi mmuo ahuba ya ama.

  21. Okenye kwachaa akpiri iwa oji…umu mmuo atoo nti n’ala

  22. Elebe okenye anya n’onu o dika o jighi ya ቨu ara

  23. Ukwu n’esi nwata okenye kwu nazu ike

  24. Ofo okenye gooro nwata bu ofo ugo.

  25. Okwu okenye bu okwu mmuo

  26. Afu ekwughi na eme okenye, mana ekwuo abughi n’eme umuaka.

  27. Okenye gaba ihe hapu akpa ya odika ona aga egwu onwa.

  28. Okenye jide oji na aka,o doo ala aka n’nti.

  29. Okenye gwube egwu na ihu arusi,umuaka enwere ukwu gbasa okpensi.

  30. Okenye gaba ihe ghara inya akpa,odika nwata puru isi awo.

  31. Okenye nokaria n’ulo,orie nri edebelu umuaka.

  32. Okenye asughi ude,ogba ama.

  33. Okenye pisia aku,nwata enwere ya gbaba udele.

  34. Okenye taba aki,nti afunibe ibe ya.

  35. Okenye a na-achu aja o n’ araru ura gara igba ama be ndi mmuo.

  36. Okenye na-anaghi eri Oke,ya ejikwala eze ekere umuaka Oke.

  37. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Nwa-ada Chioma 3, Mazi Divine 6, Admin 1
    MAZI DIVINE CHINEDU eturuwo ugo

    1. Haha onye isi obu so ofu ka ituru?

Leave a Reply

Your email address will not be published.