ỌNỤ (Mouth)

ỌNỤ (Mouth) 

34 Comments

  1. A guhe uzo a guhe onu

  2. E lewe ogaranya anya n’onu, o di ka onughi are nne ya

  3. O nweghi onye atunyere nnu n’onu ogbupu ya

  4. Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ

  5. E jighi ọnụ etinye azụ n’azụ n’ofe

  6. Okwu bu ụzọ eruwo be Chukwu

  7. Ekwughi ekwu meru onu,ekwuo anughi melu nti

  8. Onu akoro Onye uwa by Chi ya ka akoro ya

  9. kama ọnụ n’eri ga akwụsi ịrị, nke na eribeghi erila

  10. ọnụ kọjọrọ ogiri ga emecha kọrọ ogiri rachaa

  11. ọnụ ejiri bite akụ abụghi ọnụ eji akwụ ya

  12. ọnụ akọrọ onye ụwa bụ chi ya ka akọrọ ya

  13. ejighi ọnụ egbụ ọji

  14. Were ire gi gụọ eze gi ọnụ.

  15. A nyụkọ mamiri ọnụ, ọ gba ọfụfụ.

  16. Ogbu opi na eficha ọnụ.

  17. Ụdara si na ọ bụ sọsọ ya mụtara nwa ana apiwa ọnụ

  18. Nwata kwuwa ọnụ ọ si na ya agwagbụe okenye na okwu.

  19. Onye hapu onu ya, uguru arachaa ya.

  20. Ogbo na ogbo ra,bu na okwu onu.

  21. ọnụ kwurụ njọ ga ekwụ mma

  22. ọnu gi bụrụ mma, o bee gi ịre

  23. Elebe okeye anya na ọnụ odika ojighi ya wee ṅụọ ara

  24. o ji nkakwụ bee ya ọnụ, o ji ọkụkọ bee ya ukwu

  25. anyụsia n×× apighi ya ọnụ, ọ dika otoro

  26. Onu Anaghi aga be onu gbara aka

  27. E kwere maka ihe ọnụ kwuru, egbukaa ụlọ

  28. Aka nọrọ nkịtị, agụụ egbuo ọnụ

  29. ọnụ kpụrụ nri n’ọnu, ọ gba nkịtị

  30. Na ọnụ kwuru kwute bụ onye Chukwu chọrọ ịzọ ndụ

  31. ỌBỤGBA OKWE: Mazị Ogbuabia 3, Mazi udogu 6, Anonymous 2, Mazi Nnaemeka Ibe 16, Oriaku Dumebi Oji 1. MAZỊ NNAEMEKA IBE eturuwo ugo

  32. Hmmmm odika obu ubochi uka ka ufodu ji enweta ohere…nke taa atoka ka onye obula siri puta n’igwe….onyisi tinyebezia ya n’ubochi uka hoo!haa!!

Leave a Reply

Your email address will not be published.