Ọrịa írí (Meningitis)

Spread the love

ỌRỊA ÍRÍ (MENINGITIS) NKE ỌHỤRỤ BATARA NAIJIRỊA.

Ọrịa írí ọhụrụ nke anakpọ Cerebrospinal Meningitis (CSM), Neisseria Meningitides ụdị Ch (type C) abatama obodo anyị bụ Naijirịa nke mbụ.

USORO MGBOCHỊ ỌRỊA ÍRÍ ỌHỤRỤ NKEA.

(1) Izere njubiga ókè nke mmadụ.
(2) Ihi ụra ebe dị ventịlet.
(3) Izere nso na ruo ogologo oge kọntatị ọrịa írí.
(4) Mkpofu kwesịrị ekwesị nke ihe eshipụtara n’ime akụkụ okuku ume na akpịrị.
(5) Echesinu ememe ọcha na ịdị ọcha nke aka, na nje n’ime ikiaka nkwonkwo/aka uwe.
(6) Belata ikwe aka, isutụ onwe ha ọnụ, ekere òkè arịa, inyere aka nke ọgwụ dika iji ọnụ tutee mmadụ.
(7) Ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa dị mkpa nke anakpọ sero-type meningococcal.
(8) Izere inye ọgwụ nke onwe.
Dika obodo anyị n’enwe ihe efesa Cerebrospinal Meningitis (CSM) ugbua, nke gbasara gafere obodo anyị na ukwuu n’ime emetụta steeti ndị dị n’akụkụ elu nke obodo anyị bụ steeti ndi ugwu ndị dabanyere na Afịrịkan Meningitis Belt.
Obodo ndị ọzọ nwekwara oyiri ihe ndapụta nke a bụ obodo agbata obi anyi nke ọdida anyanwu Afịrịka dịka Niger, Chad, Cameroun, Togo, na Burkịna Faso.
Obodo ka ibu nke Afịrịkan Meningitis Belt gụnyere obodo ọgọ na isii, bido na Senegal, Gambịa, na Guinea Bissau na ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri ruo na obodo ndi nke ọwụwa anyanwụ nke Eritrea na Ethopịa.
Nke a abụghị nke mbụ ọrịa írí bịara obodo anyị, nke mbụ bụ Neisserịa Meningitides ụdị A (type A),ma nke afọ a bụ Neisserịa Meningitides ụdị Ch (type C) na ọrịa a ogu na nke mbụ.
Steeti ndi nwere Cerebrospinal Meningitisna Naijirịa bụ: Zamfara, Kastịna, Sokoto, Kebbi, Niger, Nassarawa, Jigawa, FCT, Gombe, Taraba, Yobe, Kano, Osun, Crọss Riva, Legọsị na Plateau.
Obidoro na Zamfara na Novemba 2016.

1 Comment

  1. Dọkịnta ndewo, biko mgbe ọzọ ị gwa anyị maka ọrịa ọrịa ụmụ nwoke (Prostrate )




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.