Ọrịa Ishi anya oghe (Glaucoma)

Spread the love

Ụmụ Igbo ndewonu. Achọrọ m k’anyị leba anya maka ọrịa ishi anya oghe nke ndi bekee kpọrọ Glaucoma.

GỊNỊ BỤ ỌRỊA ISHI ANYA OGHE?
Ishi anya oghe bụ otu n’ime ọria n’ebute mmadu ikpu ishi. Ọ n’ebute ishi na-adịgide adịgide.

GỊNỊ N’EBUTE ỌRỊA ISHI ANYA OGHE?
Ihe n’ebute ishi anya oghe bụ oge mgbasa ọmụmụ anya kpọchiri ma ọbụ dikwuo nke n’eme ka mgbali anya dị elu.

KEDỤ IHE N’AKPATA IHE IZE NDỤ ISHI ANYA OGHE?
Ihe n’akpata ihe ize ndụ ishi anya oghe bụ:
(1) Ndị nwere obara mgbali elu.
(2) Ndị nwere anya mgbali dịkwuo
(3) Ndị ruru iri afọ anọ ma ọbụ karia.
(3) Ndị nwere ọria ishi anya oghe n’ime ezi na ulọ ha.
(4) Ndị nwere nsogbu anya bụ mayopịa dị elu.
(5) Ndi agbụrụ isi ọjii.
(6) Ndị nwere conịa mkpa.
(7) Ndị nwere ọrịa shuga.
(8) Ịñụ ọgwụ n’ekwesịghị ekwesị dịka ọgwụ cọrtisone ma ọbụ sterọid.

KEDỤ MGBAÀMÀ ỌRỊA ISHI ANYA OGHE?
Na mbụ,mgbe ọrịa ishi anya oghe bidoro ọhụrụ,ọrịa ishi anya oghe enweghị mgbaàmà. Dika oge n’aga,ọge mgbali anya dịrị elu,ma ọbụrụ na elebaghị ya anya n’oge,ọtụtụ ihe mgbaàmà ndịa nwere ike ịbịa:
(1) Oké isi ọwụwa.
(2) Oké anya mgbu.
(3) Ọhụụ ebu (ahụghị ụzọ nkeọma),ọkachasị n’abalị.
(4) Okirikiri ọkụ n’isi ntụpọ.
(5) Ahụghị ihu mmadu nkeọma.

KEDỤ ỌGWỤGWỌ ỌRỊA ISHI ANYA OGHE?
Anaghị agwọ ishi anya oghe agwọ,kama achọpụta ishi anya oghe n’oge, ana eji ọgwụ were jikwaa ya ma mee ka mgbali anya wee gbatuo. Ma ọbụrụ na ọgwụ agbatughi mgbali anya dị elu,ana eji ịwa anya wee jikwaa ya mee ka mgbali anya wee gbatuo.
Onye nwere ya g’anọ na maneeji.

NDỤMỌDỤ.
Onye ọbụla nwere ihe ize ndụ ndia ma ọbụ ihe mgbaàmà ndia g’ejisike gbara ọsọ gaa hụ dọkịnta anya nke gụrụ akwụkwọ dị elu maka anya,nweekwa ntozu maka anya wee nyocha anya nke elele na ule anya. Nkea g’eme ka egbochie ọrịa ishi anya oghe maka mgbochi ọrịa ka nma karịa ọgwụgwọ.

Site na:
Dọkịnta Achụkọ Nnamdị
Ọkachamara maka Anya.
Akara ekwentị:
efu,asatọ,efu,atọ,ise,asatọ,atọ,efu,itoli,asatọ,ise.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one × one =