Ndi Fulani na-achị ehi awakpola ndi Adamawa

Spread the love

Ndi  Fulani na-achi ehi ka anyị na anụ ugbua na ha wakporo obodo nta dịgasị na Lawaru nakwa  Dong dị n’Okpuru Ọchịchị  Demsa nke Adamawa Steeti.

Site n’ozi e nwetara n’aka Onyeisioche Okpuru ọchịchị Numan, ndi mwakpo a na-esu obodo nta ndi ahụ ọkụ

N’abalị ole mole gara aga, a na-enwe ọghaghara n’Adamawa Steeti n’etiti ndi Fulani na ndi Bachama nke butere na ndi Fulani gburu ndi uwe ojii madụ anọ e zitere n’ebe ahụ maka ime udo.

 

Imerime ndi bi na Numan agbagala ọsọ ndụ na Yola maka egwu mwakpo ndi Fulani. Izu ụka abụọ gara aga e gburu ndi Fulani ruru madụ iri ise n’ebe ahụ.

 

Ka ọ dị ugbua, otu jikọtara ndi Alakụba nakwa ndi ogbo ha nke ndi otu Kristi, ngalaba Adamawa Steeti akatọọla ịkwafu ọbara a na-aga n’ihu ma kpọkwaa oku ka anwuchikọọ ndi na-akpa ya bụ arụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.