Ahọpụtawo Ọkaikpe Ukwu Anambara Steeti dịka Onyeisi Otu Mbaụwa Ndi Ọkaikpe

Spread the love

 

– Chioma Ikeakọ

Ahọpụtawo  Ọkaikpe Ukwu nke Anambara Steeti, Ọkaikpe Pita Umeadị dịka Onyeisi Otu Mbaụwa Ndi Ọkaikpe n’ọgbakọ kwa afọ abụọ ndi otu a nke iri abụọ n’ise ya e mere n’obodo Karibii mmiri gazuru bụ Aruba.

Site na nhọpụta a, Ọkaikpe ukwu ahụ abụrụla onye otu bọọdụ nlekọta Otu Mbaụwa nke ndi na-ekpebi ikpe(Jurists), WJA nke ga-eme ka Naịjiriya nweta ohere ịbụ mba Afrịka mbụ ebe a ga-ebute ọgbakọ kwa afọ abụọ nke otu ahụ nke a ga-eme n’ọnwa Ọktoba afọ 2019.

Ka ọdị taa, Sọọsọ Ọkaikpe Umeadị nke Naịjiriya bụ onye si Afrịka nọ na ya bụ otu mba ụwa

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.