ỌGBỤGBA OKWE: Mazị Mba Udogu 10, Mazị Chidi Eze 1, Mazi Nnaemeka Ibe 1. MAZỊ MBA UDỌGỤ (ỌKAIBE ILU hoo!haa!!) eturuwokwa ugo ọzọ taa. Bikonu, keduzi ụmụ nwanyị anyị? Keduzi maka ndi ọhụrụ? Madụ atọ sọrọ mpi ụnyahụ bụcha ndi aka ochie, ndi ọkaibe ilu. Ọ kwanụ gidi gidi bụ ugwu eze, anyị buo ibu n’asọmmpi a, ọ kara ụtọ, hoo!haa!!
N’isi n’isi ha bụ n’ọnụ
0
0
Tuu bụ isi opi
0
0
Isi kote ebu, ọ gbaa ya
0
0
Isi mkpi nọ n’akpa mkpi
0
0
Isi akwa adịghịzị n’ebe e zochiri ya
0
0
Onye na-enyo, isi ya a na-apụta
0
0
Uka a kpara akpa, eji isi ekwe ya
0
0
isi nwa-eze anaghị efu na mba
0
0
Isi akwu dara n’ala emetula aja.
0
0
isi mkpi di na akpa mkpi
0
0
Is I kara aka na-ebu ogidi
0
0
Ngwere isi kara aka na-eje ọgụ agbịrịgba