N ubochi taa n’erimeri ndi kIgbo, anyi ga amu ka esi ete ofe onugbu. Onugbu bu nnukwu ofe n’ala Igbo kachasi na mpaghara steeti Anambra. Akwukwo onugbu na ama Mma nke ukwuu na aru na agwo kwa otutu ori
Ngwa nri e ji Ewi ofe onugbu(recipe)
Ede, ogili akwukwo,anu
Okporoko,azu mangala, isha, ose nnu, mmanu.
Usoro esimesi
I ga-ebuzo sinye ede na oku, o ghe, I suo ya asu. Sinye anu gi na okporoko na oku, mgbe o ghere, I konye ede n’ime ite, osua, itinye mmanu were bido kwanyebe ihe nri ndi ozo dika isha ,ose,nnu,ogili dwgz. Mgbe I ga etinye onugbu, agaghi akpaghari ya ngwa ngwa itinyere ya na ite. mgbe I ga esi anu, agaghi etinye ya aribasa n’ihu na aribasa na ogili Igbo adighi agako. Mgbe ikwanye siri ngwa iji esi ofe, ikpagharia ya. Onugbu gi ghe,ofe gi asara go oku. Erimeri eghe kwa.
Erimeri ndi igbo
2017-12-07