Ịkpọghachite onye uwe ojii gbagburu ụmụokorọbịa Ndigbo isii n’Apọ bụ arụrụala megidere madụ nile-Ọhaneze

Spread the love

Onyeisi Ọhaneze Ndigbo, Ichie Nnia Nwodo akọwaala mkpọghachi akpọghachiri onye uwe ojii ahụ gbagburu ụmụafọ Igbo madụ isii bụ ndi ahịa n’Abụja n’afọ 2005 dịka arụrụ ala megide madụ nile. ọ sịrị na ọ jọgburu onwe ya bụ etu Gọọọmentị Etiti siri kwado ịkpọghite ya bụ onye ogbu ọchụ ahụ bụ DCP Danjuma n’ọrụ karịa ikpe ya ikpe etu o kwesiri. Nwodo kọwakwara na ihe a Gọọmentị Etiti mere bụ ịkụnye ajọ mkpụrụ n’ala a.

 

Chetakwa na ọ bụ n’afọ 2015 ka ndi uwe ojii gbagburu ụmụ nwoke ise ahụ nakwa otu nwa agbọghọ ha na ha so n’ihi na nwa agbọghọ ahụ ekwetaghị onye uwe ojii ogbu ọchụ ahụ bụ Danjụma mgbe ọ chụrụ ya n’ụlọ egwu awantịlọ (Niteclub) nke dị na Gimbiya Striiti n’Abụja

Leave a Reply

Your email address will not be published.

15 − 3 =