N’Ondo,Ndi Ukochukwu ejirila otumokpo dinaa umu nwanyi na-acho di aghara aghara

Spread the love

 

Akure: N’Akure, Ondo Steeti, Aka akparala ndi ukochukwu abuo maka iji were na-edina umu nwanyi ndi uka ha aghara aghara. Ndi nwuchikoro ha bu ndi oru nchekwa  Nigerian Security and Civil Defence Corps, NSCDC.

A choputara na ha na-eji ogwu were na-arata umu nwanyi ndia n’ulo uka ha.

Ndi ukochukwu aruru ala ndia na-agwa ndi inyom na-acho di na ndi nke na-acho nwa ka ha bia ka ha chupu ha ajo mmuo na-egbochi ha inweta ihe ha na-acho.

 

Ego ha napuru ndi inyom ndi arukwara nde puru nde Naira.  Ndi oru nchekwa Civil Defence kpuputara madu abuo ahu ya na otumokpo ha jigasi aru oru ojoo ndi n’ihu ohaneze.

Ulo uka otu n’ime ha di n’ilorin, Kwara Steeti ebe onye ozo bu na Idanre, Ondo Steeti.

 

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.