Sọltan Sokoto abachiela ụlọakwụkwọ iwu nke Naịjiriya ntị maka ịmachi hijab

Spread the love

Sọltan Sokoto, Mohammad Sa’ad Abubakar abachiela ndi isi Ulọakwụkwọ iwu nke Naịjiriya (Nigerian Law School) ntị maka ịmachi ụmụ nwanyị ịsụ ịchafụ ndi alakụba a na-akpọ hijab.

O kwuru na hijab bu usoro ekike ziri ezi maka ụmụ nwanyị ndi Alakụba.

ọ kọwara na ndi alakụba bụ ndi na-achọ udo. N’ihi ya, e kwesiri ịhapụ ha ka gbaso usoro okpukpere chi ha dika Allah siri kọwaa nakwa etu os siri dị na nkuzi nke Onye amụma Mohamedị.

N’izu ịka gara aga,Nwa-ada Amasa Firdaus, onye si mahadum UNILORIN ka a kwusịrị isonye n’idu n’iyi dịka onye ọka iwu maka ịjụ iyipu hijab o kpukwasara okpu ndi ọka iwu bu wig.

N’okwu nke onye nọchitere anya bụ Wazirin Katsina, Ọkammụta Sanni Abubakar Lugga, Sọltan sịrị na  Hijab abụghị ekike anabatara maka ndi alakụba, kama na ọ bụkwa ekike ndi Ụka nakwa ndi Juu.

 

“Ọkaikpe Alooma, bụbụ Ọkaikpe ukwu Naịjiriya, Ọkaikpe Bulkchuwa ma tinyekwara ọtụtụ ndi ọkaikpe ndi ọzọ  na-ekpukwasị wig ha n’elu hijab. Kansul ukwu Naịjiriya na-ahụ maka ikpe (The Nigeria Judicial Council (NJC)) enweghi mgbe o jiri si ha kwụsị ya nke pụtara na iwu-ala Naịjiriya emegideghi hijab.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.

eleven − 4 =