EZE (King)/ EZE (Teeth)

    EZE (King)/ EZE (Teeth)

23 Comments

  1. Gidigidi bu ugwu Eze/Nkita richa nsi Eze ere ewu

  2. eze fọgodu otu, a ga n’ata atụ

    1. Author

      Nnaa, ilu kele bụ ya oooo!

  3. A gbakata Eze nkịtị, ekpudo nkata n’isi gwa ya okwu.

  4. enweghi onye ma afọ ga amụ eze

  5. Were ire gi gụọ eze gi ọnụ.

  6. ọdighi mma Nkita rachasia nsi, eze ere ewu.

  7. Ọchị eze abụghị ụtọ

  8. Eze mbe si na olu oha di mma, mana
    oriri oha na-aka ahu.

  9. Eze mbe si na ihe ya ji-achiri ihe egwu
    ya aga njem bu maka ya ezu ndiegwu.

  10. owerri sụ uyo wu uyo mi na gi,ta ugba m, ṅuọ mmai m ma jiri ogodo nwanyi m mee m eze.
    – we as brothers can and would share everything excluding our
    spouses.

  11. anaghi agba aka ahụ nwata eze

  12. Nwata kwocha aka osoru ndi Eze rie nri

  13. onye otu anya na achi eze be ndi isị

  14. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Mazi Nnaemeka Ibe 10, Nwa-ada Amaka 5. MAZI NNAEMEKA IBE (Ọkaibe ilu) eturuwo ugo mana dịka anyị si eme ya, anyị ga-enye NWA-ADA AMAKA bụ onye nke abụọ ego nrite iji kwadoo ya maka na ọ bụ onye ọhụrụ n’Asọmmpi a

Leave a Reply

Your email address will not be published.