Uyo: Ụgbọala akụgbuola mmọnwụ

Spread the love
masquerade

Uyo: Ebelebe gburu ka a na-achọ ịgba ekeresimesi na mgbede Tọọzdee mgbe onye ọkwọ ụgbọala na-agba ọnwụ ọnwụ kụgburu mmọnwụ na-agara onwe ya n’ụzọ Nwaniba n’ebe Use Offot.

Ya bụ mmọnwụ nke a na-akpọ “Ekpo” n’olu ndi Ibibio ka anyị nụrụ na ọ nwụnyụrụ anya ozigbo ozigbo n’ihi oke ọsọ nke ụgbọala ahụ jiri kụọ ya.

 

Otu onye bi n’ogbe ahụ, Ukpe Eno sịrị na ụgbọala kara ịkụgbu kwu ya na onwe ya ma ọ bụrụ na ya amapụghị n’ụzọ mana “Ekpo” a nwụrụ anwụ enweghi ike ịwuli elu maka ihu mmọnwụ o jiri kpuchie ihu ya.

 

“Ma ọ bụghị Chineke, a kara m ịdọrọ n’ozu ugbua. Ụgbọala ahụ ji oke ọsọ. Okporo ụzọ a aadịghị obosara, ọ bụ ebe e kwesịrị ịna-agba ọsọ karịrị kilomita iri isii kwa elekere, mana ụfọdụ na-agba ihe karịrị otu Narị kilomita kwa elekere ebea.”

 

Ọdachi a butere mgbagwoju anya, ọtụtụ mmadụ cheburu na mmanwụ, mmọnwụ ma ọbụ Ekpo anaghị anwụ, ebe ọ bụ mmụọ, keduzi ka ụgbọala siri kụgbuo mmụọ? Ka mkpuruobi mmọnwụ a zuru ike na ndokwa, Ise! Nsogbu dịkwa, hoo!haa!!

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.