Buhari kpachara anya mee ka enwee ụkọ mmanụ ụgbọala iji were bulie ọnụ ahịa ya-Fayoshe

Spread the love

Aka na-achị Ekiti Steeti, Ayodele Fayose, ekwuola na ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari kpachara anya mee ka enwe ụkọ mmanụ ụgbọala iji majaa ndi Naijiriya ka ha kweta na ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala.

 

Fayose kwuru nkea  mgbe  ọ na-eleru anya n’usoro Gọọmentị steeti ahụ jiri enyeaka site na ire mmanụ ụgbọala otu Narị Naịra na iri anọ n’ise maka otu lita dịka o siri kwe na nkwa n’ọdụ mmanụ ụgbọala n’Iyin Ekiti.

O kwuru sị: “Oge eruwo mgbe ndi Naịjiriya ga-eji mata na m anaghị egwu egwu n’okwu m na Gọọmentị Etiti chọrọ ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala. Ya bụ Otu Narị Naịra na iri anọ n’ise kwa lita dị oke ọnụ, ya fọdụzịa ibulikwa ya elu ọzọ.”

“Ya mere m jiri gụpụ onwe m na $1 ijeri maka agha Boko Haram maka na mkpa anyị dịgasị iche. Anyị ga na egbu onwe anyị oge ma ọ bụrụ na ebidoghi chịba Naịjiriya n’usoro ọchịchị dịka “federation”. Ụmụ amala ga ekpebilata ụzọ naịjiriya ga-esi gaa n’ihu”

“E kwubuola m na 2019 bụ ohere maka ndi Naịjiriya ịhọrọ ịgbanwe ajọ mgbanwe e nwere ugbua ma ọ bụkwanụ ịnọgide n’oke ịta ahụhụ

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.