Ebubo izupu ego mmanụ agbidi karịrị otu nde ijeri Naịra: Kwuo eziokwu, PDP na-agwa Gọọmentị APC

Spread the love

pdpAbụja: Otu Ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) agwala Gọọmentị Etiti  nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) ka ọ gwa ndi Naịjiriya eziokwu banyere ego enwetegasịrị na ire mmanụ agbidi, ọ kacha nke ụlọ-ọrụ iri n’asatọ edebanyeghi aha ha n’akwụkwọ bụ ndi nke e  jiri bupu ma zupu mmanụ agbidi ọnụ ahịa ya karịrị otu nde ijeri Dọla ($1 trillion) n’ime otu afọ gara aga.

PDP sịkwara na Gọọmentị Etiti na-ekwuchi “iri ngari mara oke abụba nke metụtara ndi APC” n’ihe gbasatara ụkọ mmnaụ ụgbọala na-aga n’ihu ugbua n’ala a.

 

N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ha  bụ Kola Ologbondiyan weputara n’Abụja, n’ụbọchị Wenzdee, otu PDP sịrị “ọ jọgburu onwe ya na ndi APC nakwa Gọọmentị Etiti ka nọsiri ike n’ịsị asị, ọ kacha n’okwu banyere ihe butere oke ụkọ mmnaụ ụgbọala dị ugbua nakwa afọ agbapuru ha n’atụmatụ ha iji kpịrị otu ijeri Dọla ($1 billion) n’ego mmanụ agbidi gafere oke { Excess Crude Account (ECA)}.”

Otu PDP gwara Gọọmentị APC ka ha kọdebe ọnụ, ma gwa ndi Naịjiriya nke bụ eziokwu

“Gọọmentị APC a abụghị sọọsọ na ha amaghị ọchịchị ma juputakwa na iri ngari, kama ha bụ ndi iji okwu asị tighari ndi mmadụ anya dị n’ọbara”

” Anyị chetara na ndi APC kwere ndi Naịjiriya nkwa na ha ga-akwụsị isi ofesi ebubata mmanụ ụgbọala ma ha banye n’ọchịchị maka na ọchịchị PDP nọ oge ahụ atọọla ntọala ịruzigharị ọdụ nsiputa mmanụ agbidi dịgasị n’ala a

“Ọ dịzỊ mwute na ndi APC na amaghị nke ekwe na-akụ, n’ime ihe na-achọiruzi afọ atọ ha nọ n’ọkwa, enwebeghi ike tinyekwuo otu lita n’elu nde lita ise nke Gọọmentị PDP na-emeputa mgbe ahụ.

Egwu dikwa, hoo!haa!!

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.