
WỌRỊ: Ndi agha Joint Task Force nọrọ ụbọchị Tọọzdee were gbagbuo otu onye ọnụọ ọlaa Naịja Delta ka ha na ha na-akwakọrịta mgbọ. Asịrị na ndi ọlụọ ọlaa ahụ jiri ngwa ọgụ katara ahụ wakpo ụlọ ikwu ndi agha ahụ n’Aladja.
Ozi anyị nwetara bụ na ya bụ nkwakọrịta mgbọ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ gafere nkeji iri atọ n’etiti ndi ọnụọ ọlaa buru ibu n’ọnụ ọgụgụ siri Isaba were bịa nakwa ndi agha ndi JTF malitere n’ihe dịka elekere isii nke mgbede.
Ni ọnụọ ọlaa ndi mgbọ merụrụ ahụ ka ndi otu ha buruziri, amaghịkwa ma enwere ndi agha JTF ndi merụkwuru ahụ na ya bụ nkwakọrịta mgbọ ahụ.
Mbọ nile a gbara inweta ozi n’aka ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na Delta Steeti DSP Andru Anịamaka enweghị isi ebe enwetanwughị ya n’ekwentị