Hmm! Alụmdinanwunye facebook n’ime abalị isii!!

Spread the love
Nigerian lady marries man six days after meeting via Facebook

Facebook, unu di egwuooo! Aka unu kwa!!! Otu nwata nwoke onye Igbo anọrọla na facebook nweta ọmalịncha nwanyị ọ lụrụ n’ime abalị isii.

Nwoke a bụ Chidimma Amedu mere ihe pụrụ iche site na itinye ozi “Achọm nwunye” n’ọba ozi facebook ya n’abalị iri atọ nke ọnwa Disemba afọ gara aga, were gwa nwanyị ọbụla uche ya dị na ịbụ nwunye ya ka ọ zaghachi ya.

O kwukwere na ya na onye ahụ ga eme alụmdi na nwunye n’abalị isii nke afọ a bụ 2018.

“E toruola m ma dịkwa nkwadebe ịlụ nwanyị, a chọghịzị m igbu oge”
O kwukwara sị “Zitenu akwụkwọ mmasị unu- onye kacha tozu ka m ga-alụ n’abalị isii ọnwa Jenuarị afọ 2018. Itinye akwụkwọ ga emechi n’abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Disemba afọ 2017, ma ọ kụọ elekere iri n’abụọ nke abalị”

 O zipukwara ozi ndi ọzọ.

“A naghịkwa m egwu egwu oo, a sịkwana na ị hụghị ya n’oge. Ya gazie!”

“O nwetara ọtụtụ nzaghachi, mana nke si n’aka otu onye, Sophy Ijeoma bụ nke anya ya dị.

“Uche m dị ya, zitere m ozi n’igbeozi facebook m….ọchị egbue m,” bụ ihe ọ zaghachiri

Na mbụ, Ijeọma chere na ọ bụ egwu mana ọ na-azaghi ka ụka were na-aga

Ozi o ziteziri ya n’igbeozi facebook ya, nke mkparịta ụka ekwentị na facebook sochiri, ga-emezi ka ndụ ya gbanwee

 

Chidimma jibu ya na-egwu mana ọ bịazịrị nwewe olileanya mgbe Ijeọma sị na uche ya dị ya.

Ka ọ gachara abalị abụọ ha jiri nwee mkparịta ụka mbụ ha, Chịdịmma siri Abụja bụ ebe o bi were mee njem kilomita nari ise, were gaa Enugwu, ebe Ijeọma bi.

 

Ọ nọrọ na Shoprite were chere ya, o wee bụrụ ka ” ije love nwa nwantịntị” sịrị biri ọkụ,. “A hụrụ m ya ozigbo hụ ya n’anya” nwa-ada Ij na-ekwuzi. Ka ha nọchara elekere abụọ na mkparịta ụka nke “nwere ka o si dị”, nke nwoke sị ya bịa ka ha ga hụ nwanne nna ya bụ onye bikwu n’Enugwu.

Ij sịrị na ọ dị ya ka egwu dịkwa ya ka ọ bụ na nrọ.

“Anyị ruziri nke nwanne nna ya, ọ gwa ya sị: “Dee, lee nwanyị m chọrọ ịlụ.”

Dịka Chidimma, ndi be ha adịghị ka ndi na-ejuanya oyi na ihe maka na nwanne nna ya ahụ nyere nkwado ya.

N’omenala Igbo, inweta nkwado ezinụlọ abụọ dị mkpa n’alụmdinanwunye

 

Ij ekweghi ekwu ma o nwekwara rịị ka ha siri gwuo obere egwu oge ahụ, ọbụladị ime nsusu ọnụ mana ọ sị na ihe juru ya afọ bụ na ya bụ onye chọrọ ịlụ ya bụ onye gbadosiri anya ike na ihe ọ na-eme

“Ọ bụ ka anyị hụchara nwanne nna ya na nwunye ya ka m jiri mata na ihe a nwekwara ike ịbụ eziokwu, ọ masịkwara m”

O dukwara nwata nwoke ya na ha ka hụrụ onwe ha anya nke mbụ dugara ndi be ha. Nna ya anọghịzị ndụ, nne ya gwakwara ya na ọbụ nwanne nwoke nke okenye ka ọ dị n’aka.

Ka egwu, ka egwu, nwanne ya nwoke nke nnukwu, Ikenna nyekwuru nkwado ya. Chidimma maranụ mma nwoke ma dịkwa ọgọ n’anya.

Ụfọdụ ndi enyi Ij na-esu ya imi mana ọ chọpụtaghịdị. O kwuru sị, “Ịhụ onye nke gi, ị ga-ama”

Ha gbazịrị nkwụ n’abalị isii nke ọnwa Jenụarị, n’Ameke Ngwo bụ obodo Ijeọma. Nke a tụrụ ndi mbaụwanile nọ na facebook nakwa ọba ozi mkparịta ụka (social media) ndi ọzọ nile n’anya

Chidimma, n’ozi sịrị na ọtụtụ chere na ya na egwu egwu mana na ha ahụla na uche ya dị ya.

Ha na-akwadozi agbam akwụkwọ ha nọnwa Eprel. Unu na-egekwa. Ndigbo di egwu, hoo!haa!!

Ụmụ agbọghọ, unu ahụla uru facebook bara. “Biko, onye sị gị “Hello”, doo doo doo, egbukwala oge ịsịkwa ya “hiiiiiiii!!!!”.  Anaghị amacha, e nwere ike isi na nkute ụtaba bamizie ime ahịa maka na ọ bụ mkpụgharị ka eji ere nwa mkpi, bụrụ mkpụgharị ka nwa  kpi jikwa efu. Ya bụ, n’afọ 2018, “Ntorobịa Igbo, ma nwoke,ma nwanyị, uche unu dịkw a ya ooo, onye emekwala anya ụra. Ịhụ ihe onye dị gị kwetakwa n’egbughi oge kama ejikwala ike magoro ya elu, ibunye ya ihe i bu n’ukwu. I si otu a bunye ya, o nwekwara ike gbawaa dọọọọr.  Onye ọbụla ya ba chukwu. Ihe anyị nọ bụ, “agba ekpere chi, hoo!haa!!

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.

four × 2 =