2019: Buharị bụ “analogue”, ya azọzịla ọzọ-Mbazulike Amechi

Spread the love

Ichie Mbazulike Amechi, Onye jibu ọkwa dịka Mịnịsta na-ahụ maka Njem ỤgbọeluAviation n’agba Ripọblik nke mbụ akọọwala ihe mere na Onyeisiala Muhammadu Buharị ekwesịghị iji zọkwaa nhọpụta ọzọ.

Ochie Dike a sịrị na Naịjiriya, dịka obodo na-emepe emepe ekwesịghị ịhọpụtagharị “onyeisiala bụ analogue n’ ụwa dịzịọ digital”

Ọ  rụtụrụ  aka na Buharị nwere ikike ịzọkwa ọzọ n’afọ 2019 mana ọ kpọkuru ya ka o mee dịka odogwu mba Saụta Afrịka bụ Nelsin Mandela, onye nke chịrị sọ otu ugboro were rituo n’ọkwa.

 

Amechi sịrị;” Site n’usoro iwuala anyị, o nwere ikike ịzọkwa ọzọ. Mana, ajụjụ bụzị: ọ dị mma, ọ bụ ya bụ ihe ga-enyere ala anyị aka? Ọ chibuola dịka onye agha, o mechakwaa nweta ohere ịchịkwa dịka onye nkịtị. Ọ bụrụ mba ndim ọzọ, ọ ga-eji aka sị “O zuola, ala a egosiwo na ha nwere ntụkwaị obi ebe m’ nọ”

” Nwoke agbadago, ọ makwaghị nke a na-akọ n’ụzọ ọgbara ọhụrụ eji achị ọchịchị

Leave a Reply

Your email address will not be published.