Ọhaneze akatọọla otu komiti Osinbajọ maka ọgbaghara ndi na-achị ehi na ndi ọrụ ugbo

Spread the love

 Enugwu: Ọhaneze Ndigbo akatọọla kọmiti madụ iri nke Osote Onyeisiala, Ọkammụta Yemi Osinbajọ nọ n’isi ya nke otu National Economic Council (NEC) guzobere iji leba anya n’ọgbaghara dị n’etiti ndi na-achị ehi na ndi ọrụ ụgbo n’ala a.

N’ozi nke  Onye ndụmọdụ ya n’okwu mgbasa ozi, Ichie Emeka Atama tinyere aka, Onyeisi Ọhaneze Ndigbo bụ Ichie Nnịa Nwodo kọwara ya bụ kọmiti dịka “onye ọkụ na-agba ụlọ ya , ọ na-achụ nta oke”

Nwodo  jụrụ sị, ” Keduzi ka Gọọmentị Etiti ga-esi guzobe kọmiti ikpeziri ndi ogbu ọchụ na ndi ha gburu” . O kwukwara na site n’okwu ọnụ ndi ndu otu Miyetti Allah, na o doro anya n’aka ha dị n’ọgbaghara nakwa ịla ndụ n’iyi na-aga n’ihu n’akụkụ dị iche iche n’ala anyị ugbua.

N’ihi ya, Nwodo sịrị na ọ tụrụ ya n’anya na Gọọmentị na-eguzobere ndi ogbuọchụ a kọmiti, karịa ikpe ha ikpe otu kwesịrị ekwesi n’iwu.

“Gọọmentị Etiti, site na ịjụ inwudo ma kpekwaa ndi a na-akpa arụ na-awụ akpata oyi n’ahụ ikpe, na-egosi na ha na-adonyere ha ukwu” Nwodo kwuru.

Onyeisi ndi ọhaneze a kọwakwara na iguzobe kọmiti di etu a bụzị ịnara ndi ụlọikpe ndi nwere ikike ikpe ikpe maka ọchụ ọrụ ha ma nyekwazịa ndi a na-achị ehi obisike ịkpara aghara gaa n’ihu

Leave a Reply

Your email address will not be published.