AKỤKỌ ỤWA

NDỊ NCHE ÓGBÈ AGBAALA “PASTỌ” DINARA ỤMỤ YA ATỌ Ọ́TỌ̀ JIRI ỤTARỊ PỊAWACHAA YA AZỤ

Ígwéọ́chá: Ndi nche ógbè n’Igbo-Etche dị n’Okpuru Ọchịchị Etche, Rivas Steeti ejidela ụkọchukwu na-edina ụmụ ya nwanyị atọ.

Ha gbara ya ọtọ ma were ụtarị pịawachaa ya azụ n’ihu ụmụ ya na nwunye ya tupu kpụgara ya ndị Uwe Ojii.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na nwunye ya maara maka ya bụ mpụ ma na – ekpuchi ya nke mere nwa ha nwoke ji gaa kpesara ndị nche ógbè.

“O nweghị ihe m ga-emenwu maka ịhụnanya m nwere n’ebe ọ nọ mana a gwara ya emezịkwala udiri ihe ahụ”

Ụkọchukwu arụrụ ala ahụ kwuru na ya amaghị ụma eme, “Ọ bụ nne m ji amosu were kwanye m na ya iji mechuo m ihu ebe m lụrụ onye ọ chọghị ka m lụọ”

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Nnamdi Omoni kwuru na ndị Uwe Ojii amalitewo ime nnyocha banyere okwu ahụ.

Taqyeem – Review Options

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close