ỌNỤ

ỌNỤ   

41 Comments

  1. Egughee ụzọ, egughee ọnụ

  2. Ekwughi ekwu mere ọnụ, anụghị anụ mere ntị

  3. Ejighi ọnụ etinye azụ n’ofe

  4. Aka aja aja na ebute Onu mmanu mmanu

  5. Were ile gi guo eze gi onu

    1. Ọbụghị ọnụ nke a.
      Were ire gị gụọ eze gị ọnụ bụ use your tongue to count your teeth

  6. Nkita nile na eri nsi kama nke riri buru n’onu ka ama.

  7. Anu kporo nku na eju onu.

  8. O gbara nkiti okwu juru onu

  9. Onu koro ogiri onu ga emecha koro ogiri lacha

  10. Onu kwuru njo ga emecha kwuo mma

    1. Nkea abụghi ilu

  11. Onu mmadu bu onu mmuo.

  12. Mmiri ejula awo ọnụ

  13. Ebe nwatakịrị n’ebute ọnụ mmanụ,ka ọna apụ ọrịrị

  14. Ogbu opi n’ehicha ọnụ

  15. Otu mkpịsị aka rụta mmanụ, ozuo ọha ọnụ

  16. Nne ewu na-ata agbara, ụmụ ya n’ele ya anya n’ọnụ

  17. Ụdara sị na ọbụ sọsọ ya mụtara nwa ana apịwa ọnụ

  18. Nwata kwuwaa ọnụ, ọsị na ya ekwugbuo okenye n’okwu

  19. Ihe ehi hụrụ gbaa ọsọ ka ọkụkụ hụrụ n’eme ọnụ

  20. Onye hapụ ọnụ ya, ụgụrụ arachaa ya

  21. Agwọ loro ibe ya, ọdụ ya apụta ya n’ọnụ

  22. Ọgbọ na ọgbọ ha bụ n’okwu ọnụ

  23. Isi na isi ha bụ n’ọnụ mana mmadụ ka ibe ya

  24. Nwata n’ejighị akụ,ya jiri ọnụ ọma

  25. Elebe okenye anya n’ọnụ, ọdịka ojighị ya ñụọ ara

  26. Ọnụ agaghị anọ ya mmiri amaa eze

    1. DOKINTA i nwaala hoo!haa!! daalu oo jide ka iji

  27. Onye mutara nwa nwere ogologo onu ya biko benata ya onu na gboo o mere yie onu nkapi

  28. koloko (nnunu) si na o ga-eji onu ya kwatuo oji..ngwa nezie koloko

  29. onu kwubere kwute

  30. Okwu juru nwata onu mana o maghi nke o ga-ekwu a si jide nwata ka egbue

  31. onu data ogu e jebe okpe (okwu)

  32. A na abu ahucha onu nnunu ajuba kedu ebe o si eri nri?

  33. Oke ji oso gbaba n’onu agwo bu azu ka o ga-eji puta

  34. Nwata kwuwaa onu o si na ya agwawuola ogaranya n’okwu

  35. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Mazị Saị Nwenya 3, Mazị Chụkwụdị Okeke 8, Dọkịnta Nnamdị Achụkọ 16, Mazị Olisa Ọhaefesị 8. DỌKỊNTA ACHỤKỌ eturuwo ugo

Leave a Reply

Your email address will not be published.