A kụọla nwoke asịrị mere madụ ọ ghọrọ ewu gwo gwo

Spread the love

 

 

.

Pọt Hakọọtụ: Ndi uwe ojii si na Rumuokoro, Pọt Hakọọtụ na-eme nnyocha maka otu nwoke igwe mmadụ chọrọ igbunyụ anya maka na-asị na o mere mmadụ aghọrọ ewu.

Nwamadị a ana amaghị aha bụ onye dị iri afọ atọ n’isii ka ana-ebo ebubo na o mere mmadụ ọ ghọrọ ewu ojii n’obodo Rụkpọkwụ dị n’Okpuru ọchịchị Obio-Akpọ.

Ọ bụzị ndi uwe ojii nọ na-agbafe mgbe a na-achọ igbu nwoke a zọpụtara ya. Ha jizi ụgbọala ha bugazịa ma ya ma egbu ahụ nakwa madụ abụọ, ndi soro kụọ ya ihe n’ụlọ ndi uwe ojii ebe nwoke ahụ nọrọ nwetakwa onwe ya.

Ọ kọwara na ewu ahụ bụ anụ ụlọ ya na ya na-adị na mma.

” E si m be na-apụ were hụzịa na ewu a na-eso m”

“Ọ na-abụ m pụwa, o soro m, m zụtara ya biskiiti mana achọghị m ka o soro m taa. Ya mere m jiri gbawa ọsọ, ka m zonahụ ya. Aha ewu ahụ bụ Remember.

 

“Ọ tụzịrị m n’anya na ndi mmadụ chere na m mere mmadụ ghọrọ ewu. A na-emenwu ya eme?” ọ jụzịrị n’ajụjụ.

Nwamadị a, ewu ahụ nakwa madụ abụọ ahụ sọrọ kụọ ya ihe kanọkwa n’ụlọ ndi uwe ojii ebe a kana eme nnyocha maka   ya bụ ihe mgbagwoju anya ahụ

Leave a Reply

Your email address will not be published.