35 Comments

  1. Ihe ana agba na ntị, anaghị agba ya n’anya




    0



    0
  2. Ka ahụ n’anya ka mgbọ jiri tụọ enwe n’isi




    0



    0
  3. Okwu ana asọ anya anaghị ebi gboo




    0



    0
  4. Nwanyị n’esi ofe ogiri mara ijiji anya mpịa




    0



    0
  5. Onye otu anya na-abụ eze n’ala ndi ishi




    0



    0
  6. Ụkwụ n’aga warawara, anya n’ele warawara n’ele ya




    0



    0
  7. Ọkụkọ n’aga warawara, anya n’ele warawara n’ahụ ya




    0



    0
  8. Ana eji anya amara ọka kara ákà




    0



    0
  9. Nne ewu n’ata agbara,ụmụ ya n’ele ya anya n’ọnụ




    0



    0
  10. Oshimiri anaghị eri onye ọna ahụghị ụkwu ya anya




    0



    1
  11. Agadị nwanyị nwere onye n’elekọta ya anya sị na-agbụrụ ya n’aka nka




    0



    0
  12. Ụra g’eju onye nwụrụ anwụ anya




    0



    0
  13. Nwata bulie nna ya elu, akpa amụ ya awụchie ya anya




    0



    0
  14. Ọkụkọ sị na ihe ya ji ele anya n’elu ma ya n’añụ mmiri bụ maka ihe n’egbu ya si n’igwe abịa




    0



    0
  15. Ọkpụ ụzụ na-amaghị akpụ ogene,lee egbe anya n’ọdụ




    0



    0
  16. Ọnweghị ihe anya hụrụ gbaa ọbara




    0



    0
  17. Nwata sị na nne ya agaghị arahụ ụra, ụra agaghị adị ya n’anya




    0



    0
  18. Elebe okenye anya n’ọnụ, ọdịka ojighị ya ñụọ ara




    0



    0
  19. Asọwa anya, asọpịa anya




    0



    0
  20. Ihe dị mma n’anya bụ nwanne




    0



    0
  21. Ihe anya ji dị abụọ bụ anya ahụghị, anya ahụ




    0



    0
  22. ejighi ihe na-agba na ntị agba n’anya




    0



    0
  23. Anya ka okenye ji eke anụ dị n’ofe




    0



    0
  24. nwata nne ya gara ahịa, anya na-atọ ya n’ụzọ




    0



    0
  25. ỌGBỤGBA OKWE: Dọkịnta Achụkọ 19, Mazị Saị Nwenya 4. DỌKỊNTA ACHỤKỌ eturuwo ugo mana dịka anyị si-eme anyị ga-arịọ ya ka anyị nye onye nke abụọ bụ Saị Nwenya ihe nrite iji kwalite mmụọ ya n’ihi na Dọkịnta Achụkọ bụ ỌKAIBE ILU (O turuwo ugo ọtụtụ ugboro) ebe Saị bụ onye ọhụrụ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

14 + eighteen =