AGWỌ

AGWỌ

41 Comments

  1. Agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ ụmụaka e were ya kee nkụ

  2. Agwọ na ihe ọ loro a tọgbọrọ

  3. Agwọ na-atụ mbe na-atụ okpokoro ya

  4. Agwọ otu onye hụrụ na-aghọ eke

  5. Agwọ aghaghị ịmụ ihe toro ogologo

  6. Agwọ na-eze akụ, a sị na ọ maghị agba ọsọ

  7. Mmiri e ji sie agwọ na-atọ agwọ agwọ

  8. Agwọ jụrụ m ọdụ ga-ata onye ọzọ

  9. Agwọ loo ibe ya, o buo

  10. Agwọ n’emeghị ihe oji bụrụ agwọ, ụmụaka ejiri ya gwurie egwu

  11. Onye n’achụ agwọ n’achụ aramara. Agwọ tụọ ya,ya araa ọgwụ, ya gbuo agwọ ya araa mmiri ya

  12. Agwọ nile bi n’ọhịa ma enwere agwọ nwe ọhịa

  13. Agwọ luru ibe ya, ọdụ ya apụta ya n’ọnụ

  14. Agwọ luru ibe ya n’enwe ọdụ abụọ

  15. Onye sị na ya anaghị erị agwọ, hapụkwa mmiri ofe agwọ

  16. Nwata agahị ana nna ya azụ,ya enye ya agwọ

  17. Agwọ nilr ha otu ma enwere eke nwe ọhịa

  18. Anaghị eji nma n’adighị nkọ egbu agwọ

  19. Agwọ nile ha otu ma enwere eke nwe ọhịa

  20. Amaghị ebe agwọ abalị n’etinye isi

  21. obu oke igba iche mere na agwo enwghi umunna

  22. agwo mu na gi gburu odi mkpirisi ole,?

  23. oke ji oso gbaba n’onu agwo bu azu ka oga-eji puta

  24. Agwo no n’akirika

  25. o bweghi onye ma ebe agwọ abali dewere isi

  26. Agwọ mee elu mee ala, n’afọ n’afọ bụ ije ngala ya

  27. Agwọ tara m, a jukwala nwanne m ọdụ

  28. Agwọ na-achụ enwe ari elu, gịnị kara ya obi

  29. ỌGBỤGBA OKWE: Gịnịka 9 Chiọma 2 Dọkịnta Achụkọ 8, Ọhaefesị 4, Ngọzị Nwarụnta 1. NWAADA GỊNỊKACHI ANYAỌBASỊ eturuwo ugo. Ụmụnwanyị, unu gbalịrị ụnyahụ

Leave a Reply

Your email address will not be published.