ANYA MKPỤRỤ EGO. (CATARACT)

Spread the love

ANYA MKPỤRỤ EGO. (CATARACT)

Anya mkpụrụ ego bụ ebe gbara ọchịchịrị na-enyoanya. Ọ na ebido oge protin dị n’anya bụrụ ịkpaọhịa nke n’egbochi enyoanya ị ziga nhunuuche/oyiyi doro anya n’ala anya. Ala anya n’arụ ọrụ ịtụgharị ìhè n’abata site na enyoanya ka ọghọọ mgbaàmà. Ọ na-eziga ihe mgbaàmà na akwara ngwa anya, nke ga-eziga ha na ụbụrụ.
Anya mkpụrụ ego n’eji nwayọọ nwayọọ n’amụba, k’emesịrị(emechaa n’ikpeazụ) ya egbochie ịhụ ụzọ. Ọ nwere ike ị dị n’anya abụọ. Anya mkpụrụ ego dịkarịrị n’etiti ndi okenye.

MGBAÀMÀ ANYA MKPỤRỤ EGO.

(1) Ịhụ ụzọ ebu (kanwụrụ ọkụ).
(2) Nzogbu ịhụ ụzọ n’abalị.
(3) Ịhụ agba n’adịghị achapụta.
(4) Mmụba uche nke ntigbaa.
(5) Okirikiri ọkụ n’isi gburugburu ọkụ.
(6) Ịhụ abụọ abụọ n’anya nke ọ mere.
(7) Ịnwe mmasị ịgbanwe ugogbe anya oge nile.

GỊNỊ NA-AKPATA ANYA MKPỤRỤ EGO.

Enwere ọtụtụ ihe ndi n’apụtaghị ìhè na-akpata anya mkpụrụ ego. Ndịa gụnyere:

(1) Óké ụba mmepụta ọzịdant.
(2) Ísè sịga (ise anwụrụ).
(3) Ọtaraviolet radieshọn.
(4) Ịñụ sterọidị na ọgwụ ndi ọzọ ogologo oge.
(5) Ụfọdụ ọrịa dịka ọrịa shuga.
(6) Turuma (trauma).
(7) Ọgwụ radieshọn.

ỤDỊ ANYA MKPỤRỤ EGO.

Enwere ọtụtụ anya mkpụrụ ego dị iche iche. Ekewara ha dịka ebe ha nọ n’anya.
Ha bụ mkpụrụ anya ego:

(1) Nụkịa dị na etiti enyoanya.
(2) Kọtịkal dị na gburugburu akụkụ enyoanya.
(3) Posterịọ kapụsụla dị na azụ enyoanya.
(4) Anya mkpụrụ ego mburu pụta ụwa.
(5) Sekọndrị bụ nke ọrịa na ọgwụ kpatara.
(6) Turumatiki n’abịa mgbe enwere mmerụ ahụ n’anya.
(7) Radieshọn n’abịa mgbe mmadụ nwere ọgwụgwọ radieshọn.

IHE ỊZE NDỤ ANYA MKPỤRỤ EGO.

(1) Okenye.
(2) Ịñụbiga mmanya n’egbuegbu (mmanya n’eme n’anya) òkè.
(3) Ịse sịga (ịse anwụrụ).
(4) lbu oke ibu.
(5) Ọbara mgbali elu.
(6) Mmerụ ahụ n’anya.
(7) Ị dị n’agbụrụ(abụrụ).
(8) Óke ịkpughe anya n’anwụ. (Óke ị nọ n’anwụ).
(9) Ọrịa shuga.
(10) Mkpughe radieshọn site na X-ray na ọgwụgwọ kansa.

ỌGWỤWGỌ ANYA MKPỤRỤ EGO.

Ịwa: Ana-awa anya were wepụ enyoanya nke nwere anya mkpụrụ ego, were tinye enyoanya keakamere.

MGBOCHI ANYA MKPỤRỤ EGO.

(1) Chebe anya gị maka íhè ọtaraviolet site na iyi ugogbe anya maka anwụ.
(2) N’enyocha anya gị oge nile na ụlọ ọgwụ anya.
(3) Kwụsị ịse sịga (ịse anwụrụ).
(4) N’eri akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi nwere antiọzịdantị.
(5) Nọgide n’ịnwe ibu ibu dị mma.
(6) N’elele (n’eleru anya) maka ọrịa shuga na ọrịa ndi ọzọ.

Site n’aka Dọkịnta Achụkọ Nnamdị.

10 Comments

  1. Dọkịnta, nwoke ọma, ka Chineke gọzie gi




    0



    0
  2. Edemede gi a bara ezigbo uru, hoo!haa!!




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

18 − fourteen =