64 Comments

  1. Nkịta nyara akpa nshị agwụ n’ọhịa




    0



    0
  2. Nkịta rie nshi, ézè eree ewu




    0



    0
  3. Nkịta nwere ndidi n’ata ọkpụkpụ gbara agba




    0



    2
    1. Ọ bụghị ilu Igbo. Ị tụgharịrị ilu bekee n’igbo




      0



      0
  4. Tụpụrụ nkịta ọkpụpkụ n’ezi,hapụrụ ya na ụmụ mmụọ ọgụ




    0



    0
  5. nkita na agbọ ụja anaghi ata ata




    0



    0
  6. Nkịta ndaa tara akwa ọkụkụ ndaa




    0



    0
  7. nkita nwanyi zụrụ n’ata ohi akwa




    0



    0
  8. Nkịta ndaa tara ọkụkụ ndaa




    0



    0
  9. Nkịta n’akpọ ụja adịghị ata arụ




    0



    0
  10. Ọdịghị mma nkịta ịta ọkpụkpụ anyabara ya n’olu




    0



    0
  11. Ọnwụ nâ egbu nwankịta anaghị ekweya anụ isi nsị.




    0



    0
  12. Nkịta sị na ihe o ji eso onye afọ ukwu bụ na ọ nyụghị
    anyụ, ọ gbọọ agbọọ.




    0



    0
  13. Nkịta na-anaghị anụ ntị na-aga eri nshi ya




    0



    0
  14. Nkita adighi mma ita ọkpụkpụ anyanyere ya n’olu




    0



    0
  15. ọnwụ gbụrụ agụ owuu hụ nkita, o bee ya olu




    0



    0
  16. Ọnwụ g’egbu nwa nkịta, ọnaghị ekwe ya nụ ushi nshị




    0



    0
  17. Imi nkịta dịrị gị mma,bere ya taa




    0



    1
  18. Onye sị na ya anaghị ata anụ nkịta, ya ahapụkwala mmiri ofe ya




    0



    0
  19. otu ụbọchi nkita mmanya na egbụ ga ezụte nnawṅiri ede ara na ayi




    0



    0
  20. Nkịta sị ihe ya ji eso onye afọ ukwu bụ ọ na-anyụghị anyụ,ọ gbọọ agbọọ




    0



    0
  21. Ọkụkụ mmanya n’egbu ahụbeghị nkịta ọhịa ara n’agba(n’ayị)




    0



    0
  22. Ụsụ si nkita na ya ma ka ọ jọrọ wee jiri uchichi aga




    0



    0
  23. Umeji agụ abụghị ihe nkịta chekubere ịta




    0



    0
  24. onye rere nkita ga zụta enwe ihe ntukwu ka nọ kwa n’ulo ya




    0



    0
  25. Isi waba nkịta ara, ọmajijiji amawa ụjọ




    0



    0
  26. nkita si na ije ya na dinta kụrụ ya ahia maka na ya aṅụghi mmiri anụ nke ya na ekete ego eretere n’anụ ya so gbuo




    0



    0
  27. nkita si na ya agahi akụ mgbalụ eri n×× maka na enweghi anụ ga azọsi ya




    0



    0
  28. 1.Ihe nkita ji-eso onye afo ukwu bu ma o nyughi anyu, o gboo agbo.

    2. Nkita anaghi ata okpukpu a nyawara ya n’olu.

    3. Oke nkita na-awa akwa, o na-ekwe agu mgba?

    4. Onye akpiri ka agwunsi ya na-awa nkita, o si na o kaa ya agu.

    5. Nkita nyara akpa, nshi agwula n’ohia.

    6. Nkita anaghi ata aka na-enye ya nri.

    7. Nkita nyara akpa, anu agwula n’ohia.

    8. Nkita nwanyi kpoo anaghi agba niga niga.

    9. Ogbu nkita enyo ite, o bu ya mgbu mbu?

    10. Anaghi eji utali akpo nkita ka o bia rie nshi.

    11. Nkita si na ya noro na-eche uwa ya, a si na ya ehigbuole onwe ya n’ura.

    12. Nkita mmadu na-agwa ya nshi.

    13. O kaa mma mgbe nwa okuko bu ozu nkita eje.

    14. Anaghi enye nkita anu jide.

    15. Uro nkita bu onye daara ibe ya, ibe ya a daara ya.

    16. Emekwata anu nkita, ya aguwa ogaranya.

    17. Nkita si o na-abu ya gwa umu mmadu ka ha chuo aja ndu, ha si na ya choro i racha obara.

    18. Onwu na-egbu nwa nkita na-ebu uzo kpochie ya imi.

    19. Nkita na-ara nshi, eze na-ere ewu.

    20. Aburu na-akpa nkita anaghi eji aka ekpo nshi.

    21. Ihe aturu huru legbuo n’anya ka nkita huru na-agbo uja.

    22. Ihe ejina ite ola shiere nkita nri, o ghaghi inyu nshi ojii.

    23. Akpo nkita foo-foo, kpo ya bio-bio, ma o gbajighi ukwu, ya agbajie aka.

    24. Onye na-achupu nkita na nshi, o ya ga-eri ya?

    25. Mgbe nkita ga-anwu, o naghi anu ushi nshi.

    26. Nkita wepu odu o ji-achu ijiji, o werekwenu gini chuo ijiji?

    27. Ibaa mbubaa anaghi egbu nkita.

    28. Nkita si n’uja ka ya ji-ekele onye biara na be ya, kama olu ike ya ekweghi ka obia mara.

    29. Nkita si na eji oso agbanari onwu, ya gaahara inwu anwu n’uwa.

    30. Nkita rioro ka atupuru ya okpukpu n’ezi ma hapuru ya na ndi mmuo ogu.

    Ka m kwusigodi n’ebe a ma chebiri ndi ozo. Onye tawa ukazi ka o atatacha nga mma kwuru bie ya, o ga-ataji eze.
    Aririerimba




    1



    0
  29. Nkịta nwa dibia gbalahụ ya, a sị na-agwụ ya kpatara ya




    0



    0
  30. nkịta sị na ihe ya ji ekoli ụkwụ elu anyụ mamịrị bụ ka ọhalama (ọhaneze) hụ na ya adaghị ibi




    0



    0
  31. Anaghị eku nwankịta oku eti ya ihe




    0



    0
  32. nkịta nwanyị zụrụ na-ata akwa ọkụkọ




    0



    0
  33. nkịta ṅụrụ mman mmanụ ga-emecha hụ ka o si ya n’ọhụ na-agụpụ




    0



    0
  34. Nkịta na onye nwe ya gwube egwu, ya ọdịka ọnaghị ata arụ




    0



    0
  35. Ọtụtụ mmadụ ebea dịka Dọkịnta Arịrịerimba na ndi ọzọ na-atụagharị ilu onye ọzọ buru ụzọ tụọ. Onye isi biko lebakwa ya anya tupu ihe mmadụ aghọọ ihe onye ọzọ. Hahahahahaha




    0



    0
  36. Ihe tara nkịta tara ajọ anụ




    1



    0
  37. Ihe nkịta riri oge ọ dị ime, mere ụmụ ya anaghị ahụ ụzọ oge amụrụ ha




    0



    0
  38. Nkịta mụrụ asaa dị mma ma mgbe ọzọ ya amụkwala




    0



    0
  39. Egwu nkịta bụ onye dara ibe ya onye dara ibe ya




    0



    0
  40. Nkịta nọdịrị ala chere onye afọ n’asa maka ọ ga anyụanyụ




    0



    0
  41. Nkịta sị na ya anaghị echefu onye tarala akị oge ọ bụ nwata




    0



    0
  42. Nkịta sị na ya n’agba ọsọ aza oku ka mmiri hapụ ịma ya




    0



    0
  43. Ihe asọrọ nkịta ya rie, ọ gaghị anyụ nshi ọcha




    0



    0
  44. Nkịta sị onye ya nyere ego zụtara ya ute, welatara ya ego ya maka ịnọdị ala amala ya ahụ




    0



    0
  45. Nkịta sị na ihe ya jiri anyụwa mmamịrị welie ụkwụ elu bụ ka ọha na eze mara na o nweghị ibi.




    0



    0
  46. Nkịta sị ije dị ya ọsịsọ/ngwangwa, ọ bụ ihe mere ya jiri nyụọ mmamịrị n’akụkụ ụzọ pụta ọsịsọ/ngwangwa




    0



    0
  47. Ọbụrụna nkịta mara obi enwe, ọ gaghị asị ya bịa ka ha gwuo egwu.




    0



    0
  48. Onye nkịta bụ ọgọ ya, anaghị eji aka ebu nshị




    0



    0
  49. Mgbe nkịta g’anwụ, ọ naghị anụ ushi nshị




    0



    0
  50. Onye sị ọmụgwọ dị mfe, ya lee nkịta ọmụgwọ




    0



    0
  51. Onye rere nkịta zụọ enwe, ihe ntukwu ka nọ n’ụlọ ya




    0



    1
  52. Onye rere nkịta zụọ enwe, ihe ntukwu ka nọ n’ụlọ ya..




    0



    0
  53. ỌGBỤGBA OKWE; Dọkinta Achụkọ 28, Mazi Nnaemeka Ibe 9, Aririerimba 30, Mazi Ikechukwu Oji 5. ARỊRỊERIMBA eturuwo ugo. Hmmm, aha anyị gana akpọzị ya bụ ỌBỊA OTURUGO!! Ụmụ nwanyị, unu nile agazịrị ọmụgọeeee????




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.