OKE

OKE      

25 Comments

  1. Oke amakwala ama ata akpa dibịa,dibịa amakwala ama arụ oke ọnụ n’ọkụ

  2. Oke bi n’ụlọ gwara oke bi n’ọhịa na azụ dị nq ngịga

  3. Mmiri kọọla nkwere,ọgaghị akọrọla oke

  4. Onye ụlọ ya n’agba ọkụ anaghị achụ oke

  5. Ọbụ oke ụlọ gwara oke ọhịa ebe ngiga dị

  6. Ọchịchara bụ ome ihe eboro oke

  7. 1.ọke tara ọka afọ asaa abụzighi obere oke
    2. enweghi ihe oke bụrụ ime akpa ọka.
    3. ọkụkọ nti ike aghaghi ihụ ihe ọkụ ji nti oke eme.
    4. ọke juru ngwere si o ha

  8. Oke nwụrụ n’ima akpa ọka abụghị agụrụ gburu ya

  9. Nwa ịwụwụ onye gụrụma, agaghị agụtali ma oke ka mma ekee ya ekee nye m

  10. Agam egosị gị ihe ụmụ mmụọ ji nti oke eme

  11. Anaghị eji azụ afachi ọnụ oke

  12. Onye na-adịghị eri anụ oke,ya ejikwala ọnụ/eze ya eke anụ oke

  13. ejighi iwe oke esu ulọ olụ

  14. Oke bute, ya agbaba na ngwungwu ụlọ

  15. Oke gbachaa ọsọ, ọ g’ata akị

  16. Oke gwụ n’ọhịa, nwa mbee abụrụ eze

  17. ỌGBỤGBA OKWE: Dọkịnta Achụkọ 12, Mazi Nnaemeka Ibe 5. DỌKỊNTA ACHỤKỌ eturukwala ugo ọzọ. Bikonu, o nweghi ụmụnwanyị mara atụ ilu?

Leave a Reply to Dr. Achụkọ Nnamdị Cancel reply

Your email address will not be published.