Ibu ókè ibu. (obesity)

Spread the love

 

IBU ÓKÈ IBU. (OBESITY)

Gịnị bụ ibu ókè ibu?

Ibu ókè ibu bụ ọnọdụ ebe mmadụ n’akwakọba ọtụtụ abụba n’ime ahụ, nke nwere ike ịnwe mmetụta n’adịghị mma n’ahụike mmadụ.
Ọ bụrụ na arọahụ mmadụ bụ opekempe(ọ dịkarịa ala) pasent iri abụọ karịa k’ọkwesịrị ịdị, onye ahụ ebuola ibu. Ọ bụrụ na Body Mass Index (BMI) gị bụ n’etiti iri abụọ na ise na iri abụọ na itoli.itoli (25 to 29.9), iburu ibu. Ọ bụrụ na BMI gị bụ iri atọ ma ọbụ karịa, iburu ókè ibu.

Gịnị bụ Body Mass Index (BMI)?

Body Mass Index (BMI) bụ mgbakọ na mwepụ mmeshọ ewepụtara site na ogo na arọ gị. Ana eji ya enweta arọahụ keji ahụ,ma ọnaghị emmeshọ pasent abụba dị n’ime ahụ.

Gịnị mere ndi mmadụ ji ebu ókè ibu?

(1) Iripịa/iri ọtụtụ kalori.
(2) Ibi ndụ ịnọ nkịtị.
(3) Adịghị arahụ ụra zuru ezu/zuru óké.
(4) Ịmesasị/Ịkpaghasị homonụ endocrine.
(5) Ịñụ ọgwụ ibu.
(6) Gene ibu ókè ibu.

Ọgwụgwọ ibu ókè ibu.

(1) Ịgbanwe ezigbo ihe oriri iji buso ibu ókè ibu agha.
(2) Mgbatị ahụ na ịrụ ọrụ ahụ.
(3) Ịñụ ọgwụ ịbelata ibu ókè ibu.
(4) Ịwa ahụ ịbelata ibu ókè ibu.
(5) Ijikọta homonụ abụọ ka ha ghọọ otu mọlekụl.
(6) Ịme seelụ n’acha ọcha ha ha dịka seelụ n’acha agba aja aja.

Ọrịa ibu ókè ibu n’ebute.

(1) Ọkpụkpụ na uturu anụ ịbelata/ịmebi (Osteoarthritis).
(2) Ọrịa akwara ọbara obi.
(3) Ọrịa nsí eriri afọ.
(4) Ọbara mgbali elu.
(5) Kọlestrọl mgbali elu na triglyceride dị elu (Dyslipidemia).
(6) Nsogbu akụkụ ókùkù ume.
(7) Ọtụtụ kansa.
(8) Ịkwusị íkù ume nwa oge/keadịghịadeghị/adịghị adigide n’oge ana arahụ ụra.
(9) Mkpọnwụ ahụ (ọrịa strok).
(10) Ọrịa shuga nke ụdị abụọ.

Site n’aka Dọkịta Achụkọ Nnamdị.

8 Comments

  1. Author

    Ụmụ Igbo, tinyenụ ọnụ n’ime edemede nkea. Jụọnụ ajụjụ ebe n’edoghị ụnụ anya, kam kọwaa ya nke ọma.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

4 × 3 =