48 Comments

  1. Ụzọ maa mma, agaa ya ugboro abụọ




    0



    0
  2. Elibe ehi, libe ụzọ, mụ ewere ụzọ maka ehi bụ erichaa ọgwụchaa ma ụzọ anaghị agwụ agwụ




    0



    0
  3. Onye n’amaghị ụzọ anaghị agasi ike




    0



    0
  4. Egwu anaghị atụ afọ, oburu ụzọ




    0



    0
  5. Onye n’agba egwu n’ụzọ, onwere onye n’akụrụ ya egwu n’ọhịa




    0



    0
  6. 1. Ufu anaghi agba aka a laa uzo.

    2. A Hughes uzo, a Hughes onu.

    3. Onye si chara nri si na o di uto, o bu rule uzo ritual ya bu nri.

    4. Azu uzo anaghi erugharia ihu uzo.

    5. Mmadu anaghi egosi umu Nnamdi anya o ji-ahu uzo.

    6. A na-ebu uzo norue ala tutu a dabiri.

    7. Odu agwo larather ala no n’uzo.

    8. Egbu we ihe ruru ala, a ga-ebu uzo gbuo mkpi.

    9. Mmadu anaghi e duru nwa iko ya nwanyi, ya eburu ya uzo laruo.

    10. Uzo nkwu anaghi echi echi.

    11. Ihe a na-aso aso adighi mma inochi uzo.




    0



    0
    1. #2 bu: “Agughe uzo, a gughee onu.”




      0



      0
  7. Mbe sị ihe ya ji achịrị ihe egwu ya aga njem bụ maka ya ezute ndi egwu n’ụzọ




    0



    0
  8. Onye buru chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n’ọsọ




    0



    0
  9. Ahụ onye ana akụrụ ekwe n’ụzọ, atụnye ekwe n’ọhịa




    0



    0
  10. 12. Uzo esi huu agba ka a ga-esi ahu eze.

    13. Nwaanyi maaka di ya n’uzo, ihe cheere di ya amakuru ya.

    14. Ibu uzo aluta nwaanyi abughi ibu uzo amuta nwa.

    15. Ihe nwaanyi huru na-eti mkpu ka nwoke buru uzo huu ma na-edi ya.

    16. Abuzu otu ukwu na-ama uzo njem.

    17. Onye ajuju anaghi efu uzo.

    18. Nwa nnunu na-agba egwu n’uzo, ihe na-akuru ya egwu di nso.




    0



    0
  11. 19. Onye na-asi oru ga-ebiriri taa, ya gafee buru uzo.

    20. Uzo ogologo eriele ukwu owara.

    21. Nwata na-ete egwu n’uzo, okenye na-aburu ya egwu no n’ohia.

    22. Oku dasa nwam, dasa nwa iko m nwaanyi, a ga m eburu uzo menyo nke nwa m.

    23. Nwaanyi anaghi a maaka di ya n’uzo.

    24. Onye a na-amakuru amakuru anaghi anochi uzo.




    0



    0
  12. Mmanwụ na mmanwụ lụwa ọgụ, pụtara ha n’ụzọ




    0



    0
  13. 25. Okuko maara uzo na-añuta mmiri oma.

    26. Uzo teere anya na-ebido n’otu nzo.

    27. Nwata anaghi eburu nna ya uzo amuta diokpara.




    0



    0
  14. Nwata nwoke anaghị ebu nna ya ụzọ amụta ọkpara




    0



    1
  15. Ọbụghị otu ụzọ bara ahịa




    0



    0
  16. 28. Awachie uzo di n’ogba, ihu anaghi adi nwamkpi mma.

    29. Nwata akwo n’azu amaghi n’uzo teere anya.

    30. Okoro gara uzoije akwula jara mma na-eji ute alota.




    0



    0
  17. Nwata buru mmanwụ ụzọ, ya na ọsọ, mmanwụ buru ụzọ, mfemfe efezuo nwata ahụ




    0



    0
  18. 31. Onweghi uzo esiri gaa enu ugwu nabughi ugwu.

    32. Uzo mmadu bidoro na nwata gawa na-ego ya anya.

    33. Onye no n’uzo amaghi ihe mere n’ulo.

    34. Uzo nwata maa ka o na-aga.

    35. Osisi ukwu dachie uzo, nwaanyi aria ya elu.




    0



    0
    1. Ee woo, #32 bu
      “Uzo mmadu bidoro na nwata gawa na-edo ya anya.”




      0



      0
  19. Onye n’amaghị ụzọ iyi, ya sowe mpekere/mpempe ite




    0



    0
  20. Ikwu amaghị ụzọ, ibe ezi ya




    0



    0
    1. Nke a o bukwanu gini? Anyi ebighi kwanu n’ujo.




      0



      0
  21. 36. Oji ekwesighi iko okenye Bic hiring uzo.

    37. Uzo ariri si baa na mkpuru ka o si aputa.

    38. Uzo mmiri di iche n’uzo nku.




    0



    0
    1. O bu
      “Oji ekwesighi iko okenye bichiri uzo”




      0



      0
  22. Onweghi uzo esiri ga eluigwe di nso




    0



    0
  23. Uzo ariri diri riba n’ime onu, ka oga esi ariputa




    0



    0
  24. Ahapụkwala ụzọ epie/abanya na- ọhịa




    0



    0
  25. Ụzọ nkwụ ka ụzọ ngwọ mma




    0



    0
  26. 39. Onweghi uzo esi gaa Aro di nso.

    40. Ego umunne abuo tutara n’uzo di na ndowa.

    41. Onye meruo nga o na-eri, ya anoro n’uzo ama kelewe ekele.

    42. Uzo ndi Ichie wara ka umu ha na-aga.




    0



    0
  27. A gbaghị ụzọ azụ owere mgba, ọ gaghị echị




    0



    0
  28. mmanya ga-esere enyi n’enyi, ya tiwaa n’uzọ




    0



    0
  29. anaghi agafe onye mụ ọkụ ebute ụzọ




    0



    0
  30. onye a na-eduga ịnyụ nsị na-ebute ụzọ




    0



    0
  31. ụzọ ( ịgba ụzọ) nlụta nwanyị abụghị ụzọ (ịgba ụzọ) mmụta nwa




    0



    0
  32. nwanyị bu ibe ya ụzọ sịwe ite ga-aka ya nwee mkpọmkpọ ite




    0



    0
  33. onye buru cjị ys ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n’ọsọ




    0



    0
    1. onye buru chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n’ọsọ




      0



      0
  34. 43. Okuko obogwu si na ya agaghi ekworo n’onwu di n’uzo wee hapu ogigara ije ndi nwe ya.

    44. Nwata umunna ya dunyere ogu na-eji ukwu agbawa igodo uzo.

    45. Uzo esiri yaa okuko ka a na-esi a yaa okwa.

    46. Onye meechie uzo, ya eghewe eghewe.

    47. Uzo esi a gaa n’ihu agbara na-ere mmuo.

    48. Onye gawa nyuchie nsi/nshi n’uzo, ya lootawa, ya na ijiji ezute.

    49. Onye kpuu aturu n’uzo na-enwe ndidi.

    50. Igbo anaghi ahu uzo oma gosi nwanne ya.




    0



    0
  35. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Dọkịnta Achụkọ 20, Dọkịnta Arịrịerimba 57, Nkechi 7. ỌBỊAOTURUGU, Ichie Arịrịerimba eturukwala ugo ọzọ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.