ITE

Spread the love

ITE

13 Comments

  1. 1. Elelịa nwa ite ya agbọnyụọ ọkụ




    0



    0
  2. 2. Ite ọhụrụ g’emecha hụ ihe ite ochie hụrụ.
    3. Ọkụkụ n’ewere ite iwe, chefuo mma gburu ya.
    4. Onye n’amaghị ụzọ iyi sowe mpekere/mpempe ite.
    5. Mkpi abụọ n’añụ mmiri n’otu ite ga-asọkọta mpi




    0



    0
  3. 6. Azụ ọkpọ gwuru mmiri ukwu, gwukwaa mmiri nta, ma lagbuo n’ite ofe.
    7. Nshịkọ sị na ya gwuru iyi ukwu, gwukwaa iyi nta, ma ite agadị nwanyị sụkpọrọ ya anya.




    0



    0
  4. 8. Isi ehi anaghị agbọ n’ite.
    9. Obere ite n’agbọ n’ọkụ ngwangwa.
    10. Ihe dị mkpa n’aga n’ime ite.
    11. Ite kacha mma anaghị amịta nri




    0



    0
  5. 12. Nanị nnụnụ ọnụ ogologo n’añụ mmiri n’ite.
    13. Ite n’eshi nri, efere na-anara ekele.
    14. Ọkpụ ite n’eji mpempe ite eri nri.
    15. Ite n’ewere ọnọdụ n’elu ọkụ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

5 + 5 =