MBE/ALIA

Ilu taa bụ maka Mbe/Alia

18 Comments

  1. Author

    1. Mmiri riri enyi ka mbe hụrụ na-awa ọgọdọ; ọ ga-efe mmiri efe ka ọ ga-awụ ya awụ?
    2.Mbe si na ibu bụ nke ya, ya mere o ji kwọrọ ya na-azụ
    3.Mbe si na agha daa ya a zọgbuọ nwanyi di ime. Agha daa ndi nwere ụkwụ azọgbuo nwanyi dị ime, a kpụrụ mbe.

  2. Nwa ekweghi mbe ọmụmụ, ọ sị na nwunye di ya na-ele ya ajọ anya

  3. Mbe si na ya ga -anwu oge ndi ogbo ya na-anwu ka umuaka ghara ikpo ya ebe ( beetle) huo ya n’oku taa.
    Nwada Ngozi Nwarunta.

  4. Mbe naabo zukoo ahia uru adighi adi

  5. Mbe naabo putara mgba ofu ga akariri ibe ya mbamba afo

  6. Agwo turu mbe turu okpokoro ya, agwo adiatu mbe

  7. Mbe si na o ga aka mma ka ewere enyi kwa nna ya mana onye kaa utu si akpokwala ya aha.

  8. Mbe si na nkuzi na agu ya mana aka ya erughi n’ebe edemede

  9. Ikpe adighi ama mbe n’ogbo okwu

  10. Ana achu mbe n’ike o ga-efe elu?

  11. Ije mbe bu nwayo nwayo

  12. Mmiri oku n’egbu mbe

  13. Okenye adighi aso mbe aso

  14. Author

    mbe si na ihe ya ji-achiri ihe egwu
    ya aga njem bu maka ya ezu ndiegwu.

  15. Ebute nri amara aka NRI mbe

  16. Mbe ka atukpuru na nsi orue ka achoro ka aguputa ya osi si Mme osiso na nsi esigbuo ya

Leave a Reply

Your email address will not be published.