IHE CHEERE NDI NTORỌBIA N’IHU

Spread the love

Nwata nwoke obula ga agbaba mbo maka na o nwegasịrị ọtụtụ ihe siri ike cheere nwoke ọbụla n’ihu, ọkachasi umuaka ndi n’etonite etonite ka ha mara ma nwere ihe uwa nwayo maka na onye ji nwayo adighi emelu ahu, maka na onye jiri nwayo juru ofe roro aro ozuelu ya nri maka na adighi arapu isi aka agba uriom. Nwatakiri Obara ya na ano oku na akpari okenye m’obu rapu iji okwu okenye kporo ihe marakwa na okongwu (okenye) adiro fecha fecha ma ya kpebe ekpere ka onolue dika ya bu okenye ma megbuo ihe omere..maka na nna na ekpe ekpere ka nwa ka ya obughi ka o ka nwa ya…marakwa na okwu okenye dika okwu nde mmuo..biko sopuru onye toro gi ma sopukwara okenye maka okongwu adiro fecha fecha.

Nwoke ezuike dika chineke siri mee ya bu maka na mbo nile nwoke na agba bu maka nwanyi na umuaka (ezi na ulo) maka na afufu nwoke adiagwu agwu rue n’onwu. ya ka mkpa nwoke jiri buru agwuagwu mana onye obula nwere mkpa, obunaghi umuaka na nwa amuru ohuru.

IHE NDIA SO NA IHE CHEERE NWATA NWOKE MGBA N’ODI N’IHU;

NKE MBỤ: Mgbe nwata nwoke bidoro oru ma ọ bụ ahia nke ya, o ga ebido gbasibe mbo ike ka obulu mmadu ma soro n’inyelu ndi ezi na ulo ya aka maka n’obu ihe ekwuru n’onu emere eme k’eji ama dike.

NKE ABỤỌ: Nwata nwoke obula ga adi n’etinye iru ulo na ilu nwanyi n’uchu (budget) maka n’obu mkpuru oma di na igba mbo. mana o kwesiri i bido n’abe nna ya (ezinulo ya) ruba ya bu ulo maka na aku rue ulo a mara ebe osi, aku ruru ulo adighi agba oku..maka na nwata kpata ego okenye ejebere ya ozi.

NKE ATỌ; Nwata nwoke obula ga amuta inwe ego ndebe ($avings) maka izuta ihe ngwongwo ezi n’ulo (home appliances/properties) maka nke ezinulo ya…Ọ masi ya o zuta ugboala maka njem na ihe gbasara ezinulo..maka na onye mee ngwangwa omeghara odachi…maka na nwata mara ihe cheere ya n’iru o bido n’oge gbaba mbo.

NKE ANỌ; Nwata nwoke a ga enwezi onye enyem aka dika o kpatara ego ugbua…o ga-ezuike site na ikpobata nwunye nke aka ya onye gana elekota ihe nile onwere maka na nwanyi bu onye nchekwaba na onye nlekota ezinulo..mana i gaghi echekwa ka ikpatachaa ego were luo nwanyi maka na onye chebe mkpa ka ora ogodo akaria ya n’ukwu..maka na nwoke nwanyi n’egburu oja n’eji ukwu awuba be ndi mmuo.

NKE ISE: Mgbe nwoke a muta umu, o ga-azuha n’ulo akwukwo ma zukwa ya n’ulo site n’ikuziri ya asusu igbo, omenala igbo, ilu igbo, nsoala na ntoala be ha..maka echi maka na ikuziere nwa gi uzo di mma o gaghi arapu ya rue mgbe o tonitere.

Mgbe i mechala ihe ndia mara na iruchago oru gi na uwa, o dizialu umuaka gi ime nke ha. ihula na okenye adiro nfecha, oteela mgbe ha sibere ya bu ite..ha kachara nwere ite nkponkpo (ha kachara mara)

Ka anyi bu ndi ntorobia muta ihe na aka ndi okenye ma rube isi were uwa nwayo nwayo..ka anyi gbasibe mbọ ike n’egwu na uzo nke chukwu ka ọ diri anyi mma maka na ihe cheere nwoke aka mgba erika hoo!haa!!

#Afọ ọma ndi ntorobia ndi hoo!haa!! #”God bless our hu$$le”

2 Comments

  1. Nnaa, okwu gị kwu ọtọ, hoo!haa!!




    1



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

4 × one =