NWATA

Spread the love

ILU TAA BỤ MAKA NWATA

23 Comments

  1. Nwata bulie Nna ya elu, ogodo ayochie ya Anya.

    Nwata amaghi ihe e kere n’ ngwugwu, uche ngwugwu egbue ya.
    Nwata kwochaa aka, o soro ogaranya rie nri.
    Nwata na- acho nke ya, a si na o na awa Anya.
    E Mee nwata ka emere ibe ya, obi adi ya mma.

    Nwada Ngozi Nwarunta




    0



    0
  2. Author

    1.Nwata riri otu ibé ji na-awụle elu maka mgba chetakwa n’ikekwe ndị ha na ya ga agbakọ mgba riri ibe ji abụọ
    2. Nwata rie awọ ọjua anụ
    3.Nwata rie ihe ọna amụrụ anya ya na ụra emewe




    0



    0
  3. Author

    4 nwata akwọ na azụ amaghi na ije di anya
    5 nwa mara nna nnanna ya amagoro ndi ichie




    0



    0
  4. 1. Nwata riri amụ ebule ji ibi ụgwọ.
    2. Ebe nwata n’ebe akwa atụ aka, nne ya na anọghị ebe ahụ nna ya anọrọ ya.
    3. Nwata kwọshaa aka, ya esoro okenye rikọọ nri.
    4. Okenye ji ihe nwata welie aka elu, aka jiwe ya, o wetuo aka ya.
    5. Nwata n’etoghị eto jụọ ihe gburu nna ya, ihe gburu nna ya egbuo ya.
    6. Nwata bulie nna ya elu, akpa amụ nna ya awushie ya anya.
    7. Nwata ụkwụ njenje ka okenye isi awọ nọ n’ụlọ ihe mara.
    8. Enye nwata ihe karịrị ya, ya ajụọ sị enyere ya na onye.
    9. Nwata bido gbawa ajị amụ, ya adịka ọ ga-aka nna ya




    0



    0
  5. 10. Atụọla nwata ilu kọwara ya, ego ejiri lụọ nne ya furu efo




    0



    0
    1. Nwat ana apiara ụkwa yq na ata amaghị na ọrụ dị na ịpia ụkwa.
      2. Nwata hụ onye ọkariir ọgụ agụwa ya.
      3. Nwata rie awọ ọjụ anụ.
      4. Nwata kele onye ọ mara, ike ekele agwụ ya.
      Nwata na-asa ahụ n’afọ.
      5. Ofe nwata na-atọ nwata nwata.
      6. Nwata ike okwu na-ekwuputa ụgwọ nna ya ji.
      7. Nwata na-enwe ewu n’ajị.
      8. Nwata kwuwaa ọnụ, ọ sị na ya agwa ya okenye.
      9. Okenye mebie ihe, nwata ekpuru nkata n’isi gwa ya okwu.
      10. Ana ebu ụzọ rie ihu ọchị nwata tupu erie ihe oji n’aka.
      11. Mmadụ anaghị abụ nwata n’anu ogburu.
      12. Ofe nwata siri na-atọ nwata nwata.
      13. Onye sị nwata jide nkakwụ ga-ekunyekwa ya miri oji akwọ aka.
      14. Nwata ghara okenye ekene, okenye aghara ya n’ebe egwu dị n’ụzọ.




      0



      0
  6. 11. Nwata rie awọ, oju ya ọnụ




    0



    0
  7. 13. Agwọ n’emeghị ihe oji bụrụ agwọ, ụmụaka/nwata ewere ya gwuo egwu




    0



    0
  8. 14. Nwata n’etoghị eto yiri ọgọdọ, ikuku eburu ya na ọgọdọ ya.




    0



    0
  9. 15. Okenye/Onye nyere nwata nkakwụ, g’enyekwa ya mmiri o ji akwọ aka




    0



    0
    1. Nkakwụ ma ọbụ nkapị




      0



      0
  10. 16. Nwata sị na nne ya agaghị arahụ ụra, ụra agaghị eme ya na anya




    0



    0
  11. 17. Ọnwụ g’egbu nwa/nwata nkịta, ọnaghị ekwe ya nụ usi nsị.
    18. Ebe nwata na-ebute ọnụ mmanụ ka ọ na apụ oriri.




    0



    0
  12. 19. Okwu agwara nwata nwere nne ka nwata n’e weghị nne ji mara ihe




    0



    0
  13. Author

    7Nwata si na nne ya agaghi ehi ura, ura agaghi aga ya np anya
    8 ebe nne na adụ nwa ya ọdụ ka nke nne ya nwụrụ anwụ na amụta ihe
    9 Onye anakwana nwata ukpana ya maka na ọdi anụ
    10 onye si nwata jide nkapi nye kwa ya mmiri ikwọ aka
    11 Nwata nna ya ziri ọshi na eji ukwụ agbawa uzọ




    0



    0
  14. Author

    12 Nwata zọba nke ya, ọ bụrụ ajọ nwa




    0



    0
  15. 20. Nwata na-ata akara na-ata ego ya.
    21. Ihe okenye nọ n’ala were hụ, nwata rigoro n’elu ọgaghị ahụ ya.
    22. Elelịa nwa ite ya agbọnyụọ ọkụ.
    23. Ọchụ nwa ọkụkụ nwe adaa, nwa ọkụkụ nwe mwemwe ọsọ.
    24. Okenye chọrọ iri anụ oke n’eji eze ekere ya ụmụaka




    0



    0
  16. Author

    13Nwata etoghi eto jụwa ihe gburu nna ya, ihe gburu nna ya ewere ya




    0



    0
  17. 25. Ụdara sị na ọbụghị nanị ya mụtara nwata ana apịwa ọnụ.
    26. Nwata kwuwaa ọnụ, ọ sị na ya ekwugbula okenye n’okwu.
    27. Ọ na-abụ asị nwata sawa ahụ,ya asawa afọ ya.
    28. Nwata ọhụrụ n’eto, ọ dịka ọ ga-aka nne ya.
    29. Ngwere rigoro elu orji abụghịzi nwata.
    30. Nwata bido gbawa ajị amụ, ọ dịka ọ ga emeli ihe nna ya mere.
    31. Nwata n’ejighị akụ, ya jiri ire ọma.
    32. Nwata mara nna ya, amarala ndi chere ya n’elu ụwa.
    33. Nwata enwe jọrọ njọ, ma nne ha hụrụ ya n’anya.
    34. Nwata nwoke anaghị ebu nna ya ụzọ amụta ọkpara.
    35. Nwata dị ume ala,na anọ n’oche nna ya.
    36. Ka nshịkọ si aga, ka ụmụ ya si eso ya.
    37. Aka na ikpere abụọ na ala ka nwata agụ ji añụ ara nne ya.
    38. Nwata buru mmanwụ ụzọ,ya na ọsọ, mmanwụ buru nwata ụzọ, mfemfe efezuo nwata ahụ.
    39. Nne udele mụọ nwata ọhụrụ, ụmụ nnụnụ ebegbuo onwe ha na-akwa.
    40. Ọkụ nna gụnyere nwata n’aka, anaghị eregbu ya.




    0



    0
  18. 1. Nwa akwọ na-azụ amaghị na ije dị anya
    2. Nwata takarịa ụkwa, e gheere ya nshị ewu
    3. Ebe nwata gara pata ejula, ọ gaa ya ọzọ ọ pata ikpo nshị
    4. Nwata chọọ ịkpa (asịrị) ebe nne ya gara, ọ sị na nne ya na njem na-eme
    5. nwata mụwa elu,nne ya amụwa akwa




    0



    0
  19. 41. Ọkụkụ nwata bụ ehi ya.
    42. Nwata akwọ n’azụ amaghị na ije dị anya.
    43. Enwe sị na ọbụ nwata ya bu n’afọ ka ya ga agọrọ agọ, maka nke ya kwọ n’azụ nwere ike ghọrọ ụtụ rachaa.
    44. Nwata chọba nke ya, a sị na ọ bụ ajọ nwa.
    45. Nwata kpakarịa ibe ya na nkụ, a sị na ọ kpara ya na ajọ ọhịa.
    46. Nwata nna ya dunyere ohi, n’eji ụkwu agbawa ụzọ/mgbo.
    47. Ma ọnwụ egbughị nwata, ọ g’eru ikenga/okenye.
    48. Nwata tochaa, o chere ibe ya
    49. Nwata n’agba egwu sụrụgedee amaghị na egwu sụrụgedee bụ egwụ ndi mụọ.
    50. Nwata n’agba egwu n’ụzọ, enwere okenye na-akụrụ ya egwu n’ọhịa.
    51. Nwata takarịa ụkwa, eghere ya nsi ewu.
    52. Mmadụ anaghị abụ nwata na-anụ o gburu.
    53. Nwata mụwa ịrịgoro elu, nne ya amụwa ákwà.
    54. Ebe nwata gara bute eju, ya gaa ya ọzọ, o bute ịkpọ nsị.
    55. Okenye akọla na mba, maka nwata erie ádà nwaọkpụ nshi kpọọ ya ebe.
    56. Nwata ekweghị mbe ọmụmụ, ọ sị na nwunye di ya n’ele ya ajọ anya.
    57. Nshịkọ gbara ajị n’obi abụghịkwa nwata.
    58. Nwata mbụ agaghị ije nke mbụ, ọgaghị agba ọsọ.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

four + two =