20 Comments

  1. 1. Aka aja aja n’ebute ọnụ mmanụ mmanụ




    0



    0
  2. 3. Nwata kwọshaa aka, osoro okenye rie nri.
    4. Wepụ aka enwe n’ofe tupu ọghọọ aka mmadụ.
    5. Aka anaghị ekpuchi ọnwa.
    6. Anaghị eji aka ekpuchi afọ ime.




    0



    0
  3. 7. Okenye/Onye ji ihe nwata welie aka elu, aka jiwe ya, ya ewetuo aka ya.




    0



    0
  4. 8. Ikpe mara eziokwu, aka gwara ya. (Aka azu di ya)




    0



    0
  5. 9. Aka nri kwụọ aka ekpe, aka ekpe akwụọ aka nri




    0



    0
  6. 10. Akwaa agadị nwanyị ajọ aka, ajọ otiti/mkpu apụọ ya n’ọnụ




    0



    0
  7. 11. Ọkụ nna gụnyere nwa ya n’aka anaghị eregbu ya.
    12. Okenye nyere nwata nkapị/nkakwụ g’enye ya mmiri o ji akwọ aka.




    0



    0
  8. 13. Ebe nwata na-ebe akwa atụ aka, nne ya na-anọghị ebe ahụ, nna ya anọrọ ya.




    0



    0
  9. 14. Otu mkpụrụ aka rụta mmanụ, o zuo aka nile ọnụ.(o zuo ọha ọnụ)




    0



    0
  10. 15. Nwanyị mụta isi ofe mmiri mmiri, di ya amụta ịpị ụtara aka were suru ofe.




    0



    0
  11. 16. Nshịkọ anaghị ata arụ, ọ bụ ịna aka ya bụ ihe na-afụ ụfụ.
    17. Aka na ikpere abụọ n’ala ka agụ ji enye nwa ya ara.




    0



    0
  12. Aka mere ite o ji bee kpokororo.
    Z. Aka ka aka na-agbaji aka.
    3. Aka mkpụmkpụ ekweghị mbe koro akpa.
    4. Aka na-aga n’ike na-arụta nsị.
    5. Ebe aka ruru nwanyị ka ọ na-ekokwasi di ya.
    6. Ebe aka ruru ntị ya maa ya ura.
    7. Onye mere ka aka ha ya ji nanị ọchị eme ọjị.
    8. Ikwe na aka ghara nku aka ọghọọ njide.
    9. Mkpịsị aka niile ahaghị.
    10. Aka kpara ngaji uru egboo ọnụ.
    11. Aka kpara eze ka udele, okwoo onye chiri ya ọzọ.
    12. Onye dabaa n’olulu weputa aka ya, agụpụta ya.
    13. Onye choro igbo ọgụ buru ụzọ gboo itụ aka n’ihu.
    14. Aka weta aka weta afọ eju ọnụ.
    15. Eze tapịara nkpịsị aka nyere ya nri bụ ajọ eze.
    16. Aka mebiri, aka dozikwara.
    17. Ebe anọrọ tọọ eligwe aka bụ etiti eligwe.
    18. Aka anaghi ekwe atọgbọọ nwa.
    19. Aka kpara akụ ya rikwe akụ.
    20. Aka nri bụ aka, aka ekpe bụ aka.
    21. Aka enyere nwata ka oji eto.
    22. Elewe onye aka mgbagọ, awabie oke ala.
    23. Aka akwọrọ akwọ ka nka akwọghị mma.
    24. Aka nkita anaghị eju nkata mana ọna-ekoro n’elu.
    25. Akara aka anaghị ekwe nhicha.
    26. Eweregodu ogbo na ncha sawa akara aka, etu ọdị ka ọdị.
    27. Akara aka bụ ọnatara chị.




    0



    0
  13. 1. Onye na-atụ mmadụ otu mkpịsị aka, na atụ onwe ya mkpịsị aka anọ.




    0



    0
  14. 1. Otu mkpịsị aka anaghị ehota igwu.
    2. Aka nabọ tigbata ha etigboo ijiji.
    3. Ejiri otu aka vọọ (bọọ) otule, ọ hịrị ahịrị




    0



    0
  15. 1. Onye lie onwe ya, otu aka ya ekoro n’ elu.
    2. Aka ekpe nọ ike nso.
    3. Anaghị agha isi mkpịsị aka agba ọna




    0



    0
  16. 18. Anaghị agba aka ahụ nwata eze.
    19. Anaghị aracha isi aka agba iriọm.
    20. Onye chewe ka ya rachaa nri dị n’azụ aka, nke dị n’ihu aka awụfunarị ya.




    0



    0
  17. 21. Aka gbajie igwe, ụjọ atụwa osisi




    0



    0
  18. 22. Nne jiri aka nri kọọ nwa ya ihe, ya ejiri aka ekpe kpọta ya.
    23. Kube akpa gị ebe aka gị ruru.




    0



    0
  19. Aka nọrọ nkịtị agụụ egboo ọn.




    0



    0
  20. 1. Ewere aka abụọ chita akụ n’uko, ọraa ahụ nritu




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.