OSISI

Spread the love

ILU TAA BỤ MAKA OSISI

6 Comments

  1. 1. Osisi ka nkwụ ya chọọ aja nkwụ na-achụ.
    2. Oke osisi daa ụmụ nnụnụ eju ofia.
    3. Osisi darue ala nwanyị aria ya elu.
    4. Osisi kpọrọ nkụ, iwe na ọnụma dị ya n’afọ




    0



    0
  2. 5. Otu osisi qnaghị eme ohia.
    6. Obụghị nani otu osisi ka eji eme atụ




    0



    0
  3. 7. Osisi kwuchi ụzọ na-eri ube (apa) mma.
    8. Otu osisi anaghị afụ mmadụ n’anya ugbo nabọ.
    9. Osisi amaghị igba egwu, ikuku ekuziere ya.
    10. Osisi aturu anya ọdida anaghị ada ọsịsọ.
    11. Osisi gbụchaa akwa ọ mara ndi iro ya.




    0



    0
  4. 12. Ọgbakọ enwe bụ n’elu osisi.
    13. Osisi na-amị ego ji ahụ ya ami ya.
    14. Osisi kwụrụ osisi akwụdebe ya.
    15. Osisi ngalaba ka ụmụaka ji amụ iri enu.
    16. Elewe osisi kpọrọ nkụ anya ọdida, nke di ndụ amakara daa




    0



    0
  5. 17. Osisi amịghị ezigbo mkpụrụ si gbutoo ya.
    18. Osisi na-abụ ọ mịa ụkpụrụ mmadụ anwọọ na-esozikwa ifurụ (okoko).
    19. Osisi etiri n’ala bụ n’isi eze mụọ ka ọ dara.
    20. Osisi kwụ n’ọwa ede agadi nwanyị nọ ajọ ọnọdụ. Egbue ya egbu ọ sụgboo ede, ahapụ ya ahapụ, o mebie ede.
    21. Oke osisi anaghị akpọnwụ ụbọchi egbuturu ya.
    21. Osisi egbjiri egbuji nwere olile anya karia nke abụrụ n’ukwu




    0



    0
  6. ỌGBỤGBA OKWE: Saị Nwenya (20). Sọọsọ Saị Nwenya bụ onye mere asọmmpi. Egwu dịkwa maka na otu onye anaghị eme asọmmpi




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

16 − nine =