Okorọcha apụghị ịkwụsịnwu m- Madụmere

Spread the love

Owere:   Osote Gọvanọ Imo Steeti, Ichie Eze Madụmere ekwuola na Gọvanọ Imo Steeti, Owele Anayọ Rochas Okorọcha apụghị ịkwụsị ya ịzọrụ ọkwa ọchịchị ịbụ Gọvanọ steeti ahụ n’isi.

O kwuru nkea mgbe ndi ọnụ na-eru n’okwu n’Okpuru Ọchịchị ya bụ Mbaitoli nyere ya nkwado ha. N’ozi si n’aka onye inyeaka mgbasa ozi ya, Mazị Uche Ọnwụchekwa, Madụmere mere ka ọhaneze mara na o nweghị udiri mgba okpuru si n’aka Okorọcha ga-eme ka o sepu aka na ya bụ ihe ọ na-achụ. N’ime ndi ahụ nwere agba nyere Madụmere nkwado gụnyere Mazị Marcon Nlemigbo, onye kwuru sị: “Ọ dị mkpa anyị na ndi okpuru ọchịchị ndi ọzọ ijikọ aka ọnụ”.

N’aka nke ọzọ, Okorọcha etiela aka n’obi kwuo na ihe ruru kwanarị (percent) iri itolu n’ise n’ime ndi Ụka Katọliki na steeti ahụ ga-akwado onye ọbụla o weputara ga anọchi ya. Ọ kọwara na enweghị okwu na-esere ya na Ichie Ụkọchukwu Ụka Katọliki n’Owere, A.J.V. Obinna, tinyekwara na onye sọtara ya bụ Ichie ụkọchukwu so na ndi na-akwadosi ọchịchị ya ike.

Owelle Rochas Okorọcha nọrọ n’izu ụka ole m’ole gara aga were kwuputa na Ugwumba Uche Nwosu bụ Onowu ya ma bụrụkwa ọgọ ya nwoke bụ onye ọ kwadoro ka o weghara oche dịka Aka na-achị steeti ahụ

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.