Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe maka achụmanọrụ Globacom

Ụmụnwaanyị emeela ngagharị iwe maka achụmanọrụ Globacom

Spread the love

Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe
 

Enugwu: Ụmụ nwanyị yi uwe ojii ruru otu narị n’ọnụ ọgụgụ nọrọ ụnyahụ  mee ngagharị iwe n’Enugwu maka achụmnọrụ ụlọ ọrụ nzikọrịta ozi, Globacom chụrụ ụmụ nwanyị ndi luru di nakwa ndi muworo nwa site n’abalị itoolu nke Ọnwa Maachị afọ a.

Otu chịkọbara ya bụ ngagharị iwe bụ otu Coalition of Women for Justice mere nke onye isi ha bụ Oriakụ Onyeka Okey Udegbunam. Ha kwara arịrị na ụfọdụ ụmụ nwanyị ndi a a chụrụ n’ọrụ anọruola afọ iri na abụọ bụ ndị achụrụ n’ọrụ ma e nyere ha sọọsọ ụgwọ otu ọnwa were sị ha lawa.

 

Onyekaokey Udegbunam

Ụmụnwaanyị ndị gbakọtara ọnụ ime ngagharị iwe a bụ ndị otu Igboezue, WACOL, NAWOJ, na ndị ọzọ kwuru na ha ga na-eme ngagharị iwe ruo oge ndị Globacom ga-enyeghachị ụmụnwaanyị ahụ ọrụ ha maọbụ kwụọ ha nrubere ha niile ozigbo ozigbo.

Mana mgbe BBC Igbo kpokuru ndị Globacom, ha sị na ha ekwupụtala ebumnuche ha n’igwe Twitter ha ebe ha sị:

Onyeisi ụmụnwaanyị igboezue bụ Amaka Okonkwo, yọrọ ndị gọọmentị ka ha taa ụlọọrụ Globacom ahụhụ maka inupu isi n’iwu guzobere ọrụ na Naijirịa.

Ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwuru okwu gụnyere Egodi Igwe nọchitere anya Wacol, Ifeoma Amuta nke Nawoj, Chibota Edozie nke Nawoj na Chieso Animwagwa nke NUJ gwara ndị NCC na NLC ka ha leba anya n’usoro ọjọọ a ndị Globacom jiri kwusi ndị ọrụ ha.

Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe

Ụmụnwaanyị a na-eme ngagharị iwe ji akwụkwọ edepụtachara echiche obi ha wee site n’Ọkpara square dị n’Enugwu gaa obi gọvanọ Enugwu.

Ha gụrụkwara egwu gaa ahịa Ogbete dị n’Enugwu tupu ha agaruo n’ụlọọrụ ndị Globacom wee ziruo ozi ha ụlọ.

Ekele maka akụkọ a gaara bbc.com/igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published.

All Right Reserved: Hoo!Haa!