TIGBUO ZỌGBUO DỊ N’ETITI NDI NA-ACHỊ EHI NA NDI ỌRỤ UGBO

Spread the love

– NDI GỌVANỌ MGBAGO UGWU ALA ANYỊ NA OTU NDI NCHE EHI MIYETTI ALLAH ENWEELA ỌGBAKỌ.

Otu ndi gọvanọ Mgbago ugwu ala anyị akpọrọ Northern States Governors’ Forum mọbụ NSGF n’aha ichafụ nakwa ndi isi ọrụ nche ehi, nke ala anyị tinyere ngalaba ha na steti di iche iche, kpọrọ onwe ha Miyetti Allah Cattle Breeders Association, enweela ọgbakọ ka ọnwa atọ n’afọ a dị na abalị iri abụo n’isii.

Ihe bụ isi ahụrụ kwaba okpu n’ọgbakọ a bụ itule were chọpụta ụzọ aga-esi gbochie tigbuo zọgbuo na-adapụtawa n’etiti ndi ọrụ ugbo nakwa ndi ọrụ nche ehi kwa mgbe kwa mgbe n’ala anyị niile gbaa gburu gburu.

Ndi bịara ọgbakọ a e mere na Sokoto  gụnyere onye isi otu NSGF bụ onye bụkwa Aka na-achị Borno Steeti bụ Kashim Shettima, ndi ọzọ bịara ogbakọ a gụnyere Aminu Tambuwal bụ onye haziri ogbakọ a nakwa ogbo ha sị steti Kano bụ Abdullahi Ganduje. Aka na-achị Kaduna steti bụ Mallam Nasir el-Rufai sonyere ogbakọ a mgbe ọ na-aga n’ihu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.