ANYỊ AMAGHỊ KA ỤGWỌ ỌNWA NDI ỌRỤ OMEBE IWU SI RỊA ELU ỌJỊ – RMAFC

Spread the love

Ndi ụlọ Kọmishọnụ na-ahụ maka Mkpata nakwa ikesa ego n’ala anyị bụ Revenue Mobilization, Allocation and Fiscal Commission RMAFC, n’aha nkenke ekwola na ọbụ nanị ndi na-ahụ maka ọdị mma ndi omebe iwu ala anyị, bụ National Assembly Service Commsdion, NASC, nwere ike ịkọwa ka ụgwọ ọnwa nakwa ego mmachi akpa ndi ozọ ndi omebe iwua sinetọ si gbagoo na nde naira iri na atọ na ọkara (N13.5 million).

N’okwu RMAFC, rukwa ugbua, ihe bụ orubere onye otu onye omebe iwu sinetọ ala anyị kwa ọnwa kabụkwa otu nde naira nakwa puku naira iri isii. Mgbe ọ na-agba ama okwua, ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ RMAFC bụ Mazi Ibrahim Mohammed sịrị na nkea di mkpa iji mara ebe agwọ abalị dobere isi na ọgbụgba ama nke otu onye omebe iwu bụ sinetọ Shehu Sani kwuru si na otu onye omebe iwu sinetọ ala anyị na-enwete nde naira iri na atọ n’ ọkara kwa ọnwa tinyekwere nke bụ isi ahụrụ kwaba okpu bụ ụgwọ ọnwa ha nọ na naari puku naira asaa na naira iri ise. Na ikpọbi okwu aha, dika RMAFC si kwue, otu onye omebe iwu sinetọ ala anyị kwesiri inwete mkpakọ ma mkpakọ ego di otu nde naira, puku naira iri isii na atọ, naari naira asatọ na naira iri isii. Egburie egoa ka osi kwesi ekwesi: ego opekata mpe, N168,866:70; ego idozi ụgbọ-ala nakwa mmanụ ụgbọ-ala, N126,650; ego onye enyem aka (PA), 42,216:66; Ego ụmụ odibo ime ụlọ, N126,650:00; ego ile ọbịa, N50’660; ego ụmụ obere ihe digasi mkpa (utility), N50,660; ego akwụkwọ akụkọ, N25,330; ego afe, N42,216; ego nnlekọta ụlọ (house maintenance) N8,443 nakwa ego ọnụmara (constituency) N422,166:66.
okwua kọwara na ọdị mkpa ịmata na ụfọdụ n’ime ego ndia ka ana-akwụ kwa mgbe kwa mgbe, ebe ụfọdụ bụ ndị ana-akwụ mgbe oji dị mkpa. Ọkọwara na ego oche bụ N6,079,200:00 nakwa ego ezumike nka bụ N6,079,200:00 bụ ndi ana-akwụ ma-arụchaa otu agba ọrụ nke bekee kpọrọ tenure. Okwua gara n’ihu kwue na ego mgbazinye eji azụrụ ụgbọ-ala bụ maka nanị ndị chọrọ ya ka ana-enye ya ma kwukwa na ndi were ụdị egoa ga-akwụchie ya azụ tupu na ha awụsa ọwara ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.