NDI ỌRỤ NDLEA ANWỤCHIELA OTU NWA AGBỌGỌBỊA ZORO ỌGWỤ IKE N’UWE ARA YA

Spread the love

NDI ỌRỤ NDLEA ANWỤCHIELA OTU NWA AGBỌGỌBỊA ZORO ỌGWỤ IKE N’UWE ARA Y

Na steeti Katsina, ndi ọrụ ala anyị na-alụ ọgụ megide ọgwụ ike bụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA n’aha ichafụ anwụchiela otu nwa agbọgọbịa di afọ iri na itolu ebe o bu ogwụ megidere iwu.
Nwa agbọgọbịaa aha ya bụ Zakiya Abdukarim ka ekwuru na o zomichara ọgwụ ike ndia n’ime uwe araa ya nakwa akụkụ ahụ ya ndi ọzọ.

N’otu aka ahụkwa, anwụchikwala otu nwa ikorọbịa ji nzere mmụta na ihe ọmụmụ Geophysics aha ya bụ Mazi Iredia Austin na steeti Edo ka o bu anwụrụ ike (igbó) dị akpa iri asatọ na abụa nke nyere naari kilogram asaa na iri isii na abụa. Ọ bụ ndi ọrụ NDLEA ngalaba steeti Edo jidere nwamadia.

Onye isi ndi NDLEA ngalaba steeti Katsina bụ Oriakụ Maryam Sani bụ onye kwuru ka esiri jide nwa agbọgọbịaa dị afọ iri na itolu sịrị n’ọbụ n’akụkụ ikpere miri akpọrọ Sokoto Rima River Basin ka-anọrọ nwuchie nwagbọgọbịaa mgbe ọ na-achọ irepụ ogwụ ike ahụ. Oriakụ Sani siri na nwagbọgọbịaa bụ onye nke gbapụrụ na obodo ha ma ga soro enyi ya nwoke biri n’ime okwu ụgha nke ọ siri na nne ya nakwa di lụ nne ya chọrọ ịkwanye ya na di na abụghị uche ya. Oriakụ Sanị gụpụtakwara ụfọdụ ọgwụ nwa nwanyịaa bu dịka, Tramadol, Exol na nke akpọrọ D5. Oriakụ Sani kọwakwara ka ha na nwagbọgọbiaa siri kparịta ụbụbọ ebe ya bụ nwata nwanyịa nọrọ kọwaa ije ya na enyị ya nwoke bụ Abdulsalam gbasrara ọgwụ ndia. Okwuru na nwagbọgọbịaa si na ya na-ere osikapaa na agwa n’obodo ya bụ Tantagaria dị n’ụzọ gawara Bakiya. Ọsiri na nwata nwanyịa kwuru na mgbe ya bịakwutere enyi ya nwoke n’ọdụ ụgbọala ka ọ gwara ya ledoro ya akpa ọgwụ ndia dị n’ime ha anya ka ya weta ihe bịa ma si ebe ahụ rie mbọmbọ ọsọ, mgbe ọ matara na aka akparala ya. Ọ siri na nwagbọbiaa bụ Zakiya gọrọ aka na ụkwụ ya, na ya amaghị aha ọgwụ ndia ma kwukwa na ya anaghị añụ ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.