AKPỌGIDELE MMADỤ ASAA N’OBE NA MBA FILIPIN

Spread the love

Akụkọ anyị si na Mba Filipin nweta na-ekwu na mmadụ asaa nke otu onye n’ime ha bụ onye inyom ewerela onwe ha nye ka-akpọgide ha n’obe ka esiri kpọgide Jizọs. N’echiche ha, nkea bụ iji kwanyere Jizọs ugwu ma sorokwa ya taa ahụhụ dika ndi na-eso ụzọ ya. Mmadụ asaa ndia bụkwa ndi okpukpe ụka Ozuru-mba ọnụ bu Katọlik.

Akụkọa na-ekwu na ndi mmadụ di puku kwụrụ puku n’ọnụ ọgụ biara kirie ihe nhụsi anyaa ebe ndi isi ụka katọlik na mba ahụ gbarụrụ ihu maka isi etua gosi okwukwe.

Mmadụ atọ n’ime ndia ka anọrọ n’ugwu di na nwa obere obodo ana-akpọ San Pedro Cutud kpọdo n’obea, ebe anọrọ n’akụkụ ebe ana-akọ ugbo di n’obodo San Fernando di na mgbago Manila kpọdo n’obe nke ha.

Onye gbara ama okwua bụ otu n’ime ndi isi ọrụ ime njem nakwa ihe nkiri di n’aka n’obodo ahụ bụ Ching Pangilinan.

Ụdi ngosi okwukwe dika ndi ụka katolik n’ụzọ di etue ka-ana-ahụta dika ọpụrụ iche ma bụrụkwa ọgbara ụwa gharịị.

Ọtụtu ụmụ ogbenye ọnụ ntụ na mba ahụ na-eme ụdị ihe dị etua iji chọ mgbaghara nke njọ, ịyọ maka ọgwụgwọ nso, ịchọ ndụ ọma nakwa iji nye Chukwu ekene.

Leave a Reply

Your email address will not be published.