Yurop na-achọ imepe ụlọ erimeri okpuru mmiri nke mbụ

Spread the love

N’oge na-adịghị anya, Yurop ga enwe ụlọ erimeri (restaurant) okpuru mmiri nke mbụ ya na mba Nọọwee akpọrọ “Under” nke pụtara okpuru, nke e jiri kọnkịrị were wuo n’ikpere mmiri Nọọwee nke ndi sere ya bụ ụlọ-ọrụ na-ese ụlọ (architecture) a kpọrọ Snohetta.

E sere ya bụ ụlọ erimeri ka akụkụ ụfọdụ see elu, akụkụ ndị ọzọ adịzịa n’okpuru mmiri. Ihe eji rụọ mpio (window) ya bụ akarangwa a kpọrọ “acyrylic”

N’okwu ya, Mazị Rune Grasdal,onye ndu ndi sere ya bụ ụlọ kwuru sị, “Ọ ga-abụ ihe ịtụnanya mana obi ruo ọhaneze, ụjọ atụla ha ịnọduru ala ebe were kporie ndụ”

Ụlọ erimeri ahụga-enwe nkwago atọ (3 storeys) ma bụrụkwa nke gana-erite ihe ruru otu Narị mmadụ. N’okpuru ụzọ mbanye, a ga-enwe ọdụ mmanya “champagne” iji gosi ebe ikpere mmiri kwụsịrị osimiri were malite. A gbadatukwuo, a ga -enwe ebe erimeri ( dining room) nke ga-enwe ogologo tebulu abụọ nakwa ndi obere ga-adịgasị ya ndi ga -adị n’ihu nnukwu mpio “acyrylic” nke ga-adị fiiti iri n’atọ n’ogologo.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.