Otu ụkọchukwu amara ama ka o si ekwutọ ndi mmadụ igwuputa akụ na ụba nke ime ala na-enweghị ikikere (anti mining advocacy) na mba Filipin, ka anyị nụrụ na-agbagbuela. Agbagburu Rev. Fr. Mark Ventura ụnyahụ bụ ụka, mgbe ọ gbasara ụka, na-agọzi ụmụaka. Agbara ya ọnụ egbe nabọ n’azụ n’obodoRead More →

Ndi ụka Kraist n’ala anyị niile malitere ngagharị iwe ụnyahụ bụ Ụka, iji gosi iwe ha maka ogbugbu ana-egbuzi ndi mmadụ n’ala anyị ka ana-egbu ọkụkọ. Ọbụ n’izu ụka gara aga ka otu jikotara ndi ụka Kraist na Naiririya niile akpọrọ Christian Association of Nigeria, CAN, gwara ndi otu haRead More →

N’isi nsoa ka eweputara ihe onyonyoo nke dị n’ akụkọa, nke bụ ebe otu nwagbogọbia yi akwa yewere akụkụ ahụ ya ekwesịghị ekwesị oghe. Ọbụ eziokwu na rue mgbe anyị jiri banye ọrụ iweputara ọhaneze akụkọa, na anyị amatabeghị aha nwagbọgọbịaa, mana eri mgbe ahụrụ onyonyoo nwanyịaa n’ọba ozi ntanét,Read More →

Onye chịburu ala anyị bụ ọchị-agha, Yakubu Gowon, ekwuela na ọ na-agbawa ya obi mgbe ọbụla ya chetara ka ndi ọlụọ ọnaa bụ Boko Haram nakwa ndị Fulani na-achị ehi si egbu ụmụ mmadụ ka ana-egbu ụmụ anụmanụ n’ala anyị. Gowon gbara ama okwu ndia mgbe ọ bụụrụ aka na-achịRead More →

Otu kacha elu, n’ala Igbo bụ Ọhaneze ndi Igbo agbarụala ihu katọọ ogbugbu ahụ egburu ndi ụkọchukwu ụka Katọlik nabọ nakwa mmadụ iri na asaa ndi ọzọ bịara ụka na steeti Benue. Ọhaneze sịrị na ogbugbua ndi akpọrọ ndi nchị ehi gburu ndia enweghị atụ n’ala anyịa ma bụrụkwa nnukwuRead More →

Ị lee ‘nwagbọgọbịaa’ anya, ị gaghị ekwere na ọbụ nwikorọbịa? Ogunleye Idris dị afọ iri na itolu. Ihe ọ na-arụ bụ ike ekike dika nwanyị ma bia kwụrụ n’agịga ụzọ maka ịnara ụmụ nwoke ego. Idris gụchara akwụkwọ nke sekọndrị n’ụlọ akwụkwọ amara aha ya bụ Kings College na Legọs,Read More →

Anyị ji obi mwute ekwuputa ọnwụ mberede nke ndi ụkọchukwu anyị nabọ: Rev. Fr. Joseph Gor nakwa Felix Tyolaha VC. Ndi ụkọchukwu nabọa nọ ọrụ n’ụlọ ụka St. Ignatius Ukpo-Mbalom, na steeti Benue. Ọbụ n’ụtụtụ taa ka ndi nchị ehi Fulanị gbagburu ndi ụkọchukwua. Ka-agbara ha egbe, Fr. Tyolaha nwụrụRead More →

Kọmishọn na-ahụ maka ike nakwa inata ụgwọ ọkụ latrik nke ala anyị bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission, NERC n’aha ichafụ, adọọla aka na ntị, kwue na nsogbu ga-adapụta n’ihe gbasara ọkụ latrik ma ọbụrụ na ndi omebe iwu ala anyị ekwekọrịta imechi inye ndị enweghị mita latrik ụgwọ ọkụ N’okwuRead More →

Ndi ụlọ ọrụ okwu mmanụ ala anyị di n’aka bụ Nigerian National Petroleum Corporation, NNPC, n’aha nkenke, ngalaba na-eme nchọpụta ebe mmanụ dị, awuchiela na steeti Benue maka ọrụ ichọ mmanụ n’ikpere mmiri benue. Ana-atụ anya na ndia ga-enweta ụzọ bụ ọkacha ha ga-eji bagide ọrụ ịchọ mmanụ na steetiRead More →

Ana-atụ ụjọ na otu onye nwụrụ pịịị ebe ihe karịrị mmadụ iri abụọ na abụọ ndi ọzọ merụrụ ahụ n’ụzọ dị iche iche mgbe ndi mmọụnwụ nuru n’igwe wakpo ndi ụka n’ebe ha na-eme ekpere na HolyGhost Adoration Ministry, Uke, n’okpuru ọchịchị gọmenti ime obodo Idemili, na steeti Anambra. NdiRead More →

Gọmenti steeti Legọs ekwuela na enwere ike ghara ịkwụgbu Rev. Chukwuemeka Ezeugo bụ onye eji Rev. King wee mara. Obụ onye ji ọkwa kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ bụ Adeniji Kazeem kwuru nkea. Ọbụ mgbe ọna-agwa ndi nta akụkọ okwu kwa afọ, nke puku abụọ na iri naRead More →

Otu onye rụburu ọrụ dịka onye isi, (pastor), n’ụlọ ụka Assemblies Of God), nke Naijiriya ma jiri aka ya mee onwe ya onye isi oche otu ọ kpọrọ Northern Christian Association of Nigeria, bụ Rev. Yakubu Pam akpọkuela aka na-achị steeti Kaduna bụ Mallam Nasir El-Rufai ka o were ụlọRead More →