Ista:Enugwu gwụrụ na Shoprite

Spread the love

 Enugwu: Na mbụ, ihe a na-ekwu bụ “Aba n’anya ” mana ugbua, ọ bụzị “Enugwu n’anya”.  Maka ịgba Ista, Enugwu nile gwụrụ n’ụlọ ahịa Shoprite. Onye ọbụla tinyere isi ebea ga-eche na mmadụ afọghịzị n’ụlọ n’Enugwu taa

Madụ na-achọ ịzọgbu ibe ya, ntuoyi ha ghọrọ “ntu ọkụ”,ebe nile na-ekpo ọkụ ka agbada eji eghe garị.

Nke ka njọ bụ na ọtụtụ enweghị ihe ha bịara ịzụ, ha bịara ilegharị anya nakwa ime mkpagharị Ista. Ụfọdụ  bụkwụazị ndi aka n’akpa, ndi na-achọ ndi ha ga ezuru ego ma ọ bụ ekwentị ha.

Bikonu, o nweghịzị ndi na-aga ikiri mmọnwụ n’Obiagu! Ihe nkea dị egwu, hoo!haa!!

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one × 2 =