IKWALITE ỌDỊ MMA ỤMỤ NA-ETO ETO NA NENWE

Spread the love

N’oge mmemme Ista a, anyị bụ ndi ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ hoohaa kpọtụrụ Nenwe nke dị na okpuru ọchịchị ime obodo Anịnri, ka ọnwa Epurel (April) dị na abalị abụọ n’afọa.Anyị hụkwara ọtụtụ ihe itụnanya nakwa obi ụtọ ndi obodo ahụ ji mee ka mmemme Ista bụrụ ihe okwesiri ịbụ.

Otu n’ime ihe obi ụtọ nakwa ihe ịtụ n’anya hoohaa jiri were gbara anya ya Ista bụ ebe otú otù ihụnanya nakwa ịkwụba-aka-ọtọ kpọrọ onwe ha Nenwe Integrity Foundation nọrọ nyere ofu nwagbọgọbia aka na mbọ ọ na-agba iza oku yabu ndi otù ahụ ji akwalite ọdị mma ụmụntorọbia n’obodo ahụ.

Ya bụ nwagbọghọbịa nke aha ya bụ Nwa-ada Mercy Onyegbule ma bụrụkwa onye Amọjị na Nenwe nwetere ihe agbam ume igwe eji akwà akwá nke nwa bekee kpọrọ sewing machine.

N’igosi obi añụrị ya Nwa-ada Mercy Onyegbule toro ndi Nenwe Integrity Foundation na mbọ ha na-agba ikwalite ọdị mma ndi Nenwe, kachakwa n’ebe ụmụ na-eto eto nọ.

O kwere nkwa na ya ga na aga n’ihu inye aka n’iso kwalite mbọ ndi otu a na-agba n’obodo ahụ.

N’okwu nke ya, onye isi oche otu Nenwe Integrity Foundation bụ Ichie Dọkịnta Cyril Oleh toro nwagbọghọbia a maka ịgba mbọ ya na iza ha oku mgbe ọbụla ha kpọrọ ụmụ ntorọbịa oku n’obodo ahụ.

Ichie Dọkịnta Oleh bụ onye nwere agba n’ọrụ mgbasa ozi sịrị na mgbe ọbụla ndi Nenwe Integrity Foundation kpọrọ ụdị oku a, na Nwa-ada Mercy na-ebucha ndi ọzọ ụzọ abịa

Ichie Oleh rịọrọ ụmụ ntorọbịa ndi ọzọ ka ha na-agba mbọ na iñomi Nwa-ada Mercy ma bụrụkwa ndi na-akpa ezigbo agwa n’ebe ọbụla ha nọ.

Ọ gara n’ihu kwuo na Nenwe Integrity Foundation ka nwekwara ọtụtụ ezi atụmatụ nye ụmụ ntorọbịa Nenwe n’ọdi n’ihu.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.

fifteen − twelve =